A Gbapeela Ahịa Nkwọ Nando A Rụrụ Ọhụụ...

Dịka a sị na ihe ọma na-aka mma na ọhà mara, a gbapeela ọmarịcha ahịa Nkwọ ọhụụ ahụ a rụụrụ ndị Nando site n'aka otu nwaafọ obodo ahụ, bụ Chiifu John Iwunọ.

Guchaa Akuko a Guoo Akuko Ndi Ozo

Ọgwụ Ego: Ndị Uwe Ojii Anwụchikọọla Otu Nwoke Gburu Nne Ya

Aka ndị orụ uwe ojii na steeti Anambra akpàrala otu nwoke gbara ahọ iri ise na abụọ, bụ maazị Chiristopher Ọkadigbo, onye a na-enyo enyo na o gburu nne ya bụ oriakụ Rosaline Ọkadigbo gbara ahọ iri asatọ na abụọ ka o wee gwọchara ọgwụ ego.

N'otu aka ahụ, enyi nwoke onye ahụ a na-enyo enyo, bụ maazị Ameke Udolu bụkwa onye a nwụchikọrọ, bụ onye a na-enyo enyo na o soro kpaa nkàtà ọgwụ ego ahụ.

N'ajụjụ ọnụ a gbara ya na be ya bụ Nando dị n'okpuru ọchịchị Anambra East, Chiifu Innocent Ọkadịgbo, bụ nwa nwoke mbụ nke nwaanyị ajàdụ ahụ e gburu egbu kwuru na ahụ zuru nne ya okè tupuu ọnwụ ya, ma sị na nne ya kpọrọ ya n'abalị mbụ nke ọnwa Mee ma gwa ya na ọ ghọtaghị ka nwanne ya nwoke ahụ bụ Christopher na enyi nwoke ahụ bụ Ameke si bàta n'ime ụlọ ya, ma na-agbagharị okiriki ebe ahụ, na-ekwugasị ihe dị iche iche mmadụ apụghị ịghọta, dịka a ga-asị na ha na-agba afa.

Ọ sịkwa na nne ya gwara ya na kemgbe ụbọchị ahụ na egwu na-atụ ya ibi n'ụlọ ahụ naanị ya, n'ihi ihe ahụ ha mere n'ime ụlọ ya, ma sị na ka ọ gachara otu ụbọchị, na ihe ọzọ ọ nụzịkwara bụ ka otu onye agbataobi ha bụ Pius Aniefule kpọrọ ya n'ekwe ntị sị ya na ọ hụrụ ebe ozu nne ya tọgbọrọ n'ogbu ọbara. O kwuru na ngwa ngwa nke ahụ gachara, na nwanne ya nwoke Christopher, bụ onye akpọbeghị ya kemgbe ahọ 1999 kpọkwara ya n'ekwentị gwa ya na nne ha anwụọla, ma sị na ya onwe ya gabara njem na Minna nke steeti Naịja, ndị mmadụ wee kpọọ ya na-agwa ya ihe ahụ.

Dịka akụkọ siri kọọ, oriakụ Roseline Ọkadịgbo bụzịkwa onye e gburu, ghụkọrọ anya aka ekpè ya na mkpụrụ obi ya. Nke a mezịrị Pius jiri tibe mkpu oge ọ hụrụ ihe ahụ, ndị mmadụ wee gbakọọ n'ebe ahụ. Ma mgbe nke ahụ na-eme, ihe ọzọ a hụzịrị bụ ka Ameke siri n'otu ime ụlọ nwaanyị ahụ gbapụta, ndị mmadụ wee chụba ma nwụchikọọ ya, nara ya ekwentị ya ma site na ya chọpụta mkparịta ụka ya na Christopher, bụ onye a chọpụtara na ọ gwara ya gbara ọsọ bịa chere ya n'isi ụzọ Nteje ngwa ngwa ọ kpachara arụ ahụ, ka ha abụọ wee soro larie; ụmụ okorobịa nọ ebe ahụ wee malite ịhọ ya aka ururu họrọ ogbe ogiri.

N'okwu nke ya, onyeisi ọchịchị obodo ahụ bụ Chief Ignatius Aghadinunọ onye, bụkwa onye zọrọ Ameke Ụbọchị ahụ kwuru na obi luru ya ilu nke ukwuu oge ọ bịaruru ebe ahụ wee hụ ozu nwaanyị ahụ na etu e siri bọkasịa ya, ma hụkwa ndị ntorobịa ahụ iwe juru n'obi, na Ameke, bụ onye ha tigoro gwoo gwoo, nke mezịrị ka ọ kpọọ ndị ọrụ nchekwa ka ha wụchaa n'ebe ahụ, bịa kpụrụ ya.

Otu ọ dị, maazị Christopher ahụ bụzịkwa onye a nwụchikọrọ ebe ọ na-ezogharị na nke otu onye dibịa, wee hafekwa ya n'aka ndị ọrụ uwe ojii.

N'aka nke ya, nwanne nwaanyị ahụ e gburu egbu, bụ Chiifu Uyammadụ Anaeliakụ kwuru na ọ bụghị ụbọchị ahụ ka Christopher bidoro gwọba ọgwụ, kọọ na ụmụ iteghete n'ime ụmụ iri na otu nwaanyị ahụ mụrụ anwụọla n'ụzọ mmadụ apụghị ịkọwa, ma kpọkuzie gọọmenti steeti ahụ ka o nye aka hụ na a bọpụtasịrị ọgwụ niile e liri n'ụlọ ahụ.

Mmadụ abụọ ahụ ugbu a nọzịkwa n'aka ndị uwe ojii, ebe onye ndu ndị uwe ojii kwere nkwa na ha ga-eme nnyocha ghe anya oghe iji hụ na e sogidere okwu ahụ wee ruo n'ebe ọ kwụsịrị.

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

A Gbapeela Ahịa Nkwọ Nando A Rụrụ Ọhụụ...

A Gbapeela Ahịa Nkwọ Nando A Rụrụ Ọhụụ...

Dịka a sị na ihe ọma na-aka mma na ọhà mara, a gbapeela ọmarịcha ahịa Nkwọ ọhụụ ahụ a rụụrụ ndị Nando site n'aka otu nwaafọ obodo ahụ, bụ Chiifu John Iwunọ.

Iju Mmiri Agbàgbuola Nwatakịrị Gbara Ahọ Iteghete n'Ọgbaru, Anambra...

Iju Mmiri Agbàgbuola Nwatakịrị Gbara Ahọ Iteghete n'Ọgbaru, Anambra...

Nsogbu ahụ iju mmiri na-akpazị na steeti Anambra ugbu a ataala isi mmadụ ọzọ, dịka ọ gbàgbùrù otu nwatakịrị gbara naanị ahọ iteghete n'okpuru ọchịchị Ọgbarù, bụ otu n'ime mpaghara ebe ahụ ya bụ ọnọdụ kawanyegoro njọ.

Obianọ Ànabàtá Onyeisi Ụlọ Ọba Ego Mba Ụwa n'Ala Anyị. ■ Kwe Nkwà Ịkwàdò Amụmà Ha...

Obianọ Ànabàtá Onyeisi Ụlọ Ọba Ego Mba Ụwa n'Ala Anyị. ■ Kwe Nkwà Ịkwàdò Amụmà Ha...

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụbọchị Tuzdee wee nabàta onyeisi ụlọ ọba ego mba ụwa, bụ Maazị Rachid Benmessoud na mmadụ iri ndị ọzọ ya na ha sòrò bịa na steeti ahụ.

Ọzụbụlụ Ewere Ọñụ Rie Ji Ọhụụ...

Ọzụbụlụ Ewere Ọñụ Rie Ji Ọhụụ...

Njirimara, omenala na ọnatarachi ndị Igbo bụ nnọọ nke pụtara ìhè nso nso a dịka ndị Obodo Ọzụbụlụ, dị n'okpuru ọchịchị Ekwusigo nke steeti Anambra merùbèrè mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2018.

Anambra Ejikere Idekọta Mmemme Niile A Na-Ahazi Na Steeti Ahụ Ka Ọ Dị N'Akwụkwọ...

Anambra Ejikere Idekọta Mmemme Niile A Na-Ahazi Na Steeti Ahụ Ka Ọ Dị N'Akwụkwọ...

Dịka a sị na ihe nwee oge, o nwee nkwádóbé, ọchịchị steeti Anambra akọwapụtala njikere ya idekọta ma chekwaba mmemme niile obodo dị iche iche na steeti ahụ na-eme, mgbe ha ji eme ha, nakwa ihe a na-eme na ya bụ mmemme, ọ kachasị ndị dabara n'agbata ọnwa Ekeresimeesi ahọ a wee ruo n'ọnwa Jenụwarị ahọ na-abịa abịa.

Ìjú Mmiri: Gọọmenti Anambra Akpọkuo Ndị Ka Bi n'Akụkụ Mmiri Ka Ha Kwagharịa Ọnọdụ ■ Kpọọ Òkù Ka A Gbatakwuo Ọsọ Enyemaka...

Ìjú Mmiri: Gọọmenti Anambra Akpọkuo Ndị Ka Bi n'Akụkụ Mmiri Ka Ha Kwagharịa Ọnọdụ ■ Kpọọ Òkù Ka A Gbatakwuo Ọsọ Enyemaka...

Dịka iju mmiri gara n'ihu wee na-eme mkpamkpa dị egwu n'ọtụtụ ebe dị iche iche na steeti Anambra ugbu a, ọchịchị steeti ahụ agaala n'ihu kpọnwèé oku ahụ ha na-akpọ na ọkwa ahụ ha na-ama iji gwa ndị bi n'akụkụ ikpere mmiri na steeti ahụ kwagharịa ọnọdụ ha ma ga biri n'ebe ahụ e weputaara ha.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.