Gọọmenti Anambra Ga-Akwàdo Ndị Ntorobịa Dị Puku Iri Anọ n'Ime Ahọ Anọ --- Obianọ...

Ọchịchị steeti Anambra ekwela nkwà ịkwàdo, o pekata mpe, ndị ntoribịa ruru puku iri anọ n'ime ahọ anọ na-abịa abịa, ma mekwa ka ha guzosie ike, kwụụrụ onwe ha.

Guchaa Akuko a Guoo Akuko Ndi Ozo

Ọrụ Amalitekwala n'Ụzọ na Akwà Mmịata-Anam

Ọrụ okporo ngó okporo ụzọ na àkwà mmiri ebirikwala ọkụ ọzọ na Mmịata-Anam dị n'okpuru ọchịchị 'Anambra West' dịka ọchịchị steeti Anambra malitegoro ịbàgide n'àgbà nke abụọ nke ya bụ ọrụ.

Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọrụ okporo ụzọ, ịchọ ya mma na idozigharị ya, bụ maazị Marcel Ifejiọfọ mere ka a mara nke a dịka ọ gara n'ebe ahụ iji anya ya wee hụ ka ihe si aga. O kwuru na ọrụ ngo ahụ dị àgbà abụọ, kọwaa na kilomita ise n'ime ụzọ ahụ dị kilomita iri bụ nke a rụchapụgoro, ma meekwa ka a mara na a rụchapụla ihe karịrị pasentị iri na asaa nke ọrụ ngo ahụ, ọ bụnadị dịka o kwuru na ọrụ ga-akụrụ ọnụ ebe ahụ oge adịghị anya.

Ọ kpọkuru ma rịọ ụmụafọ obodo ahụ ndị ọrụ ahụ metụtara n'ụzọ dị iche iche ka ha kwụsị ịnagharị ma ọ bụ ịdọghachi ọrụ ahụ azụ, ma kwe nkwa ịña ntị na ilebà anya na mkpesa niile ha wetara nakwa ime ihe ha nwere ike ime, iji hụ na obi dị oke na ngwere mma.

N'okwu nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ "Kanubeen Construction Company Ltd." ji ọrụ ngo ahụ, bụ maazị Bechara Karan kwere nkwa na ha ga-ewelitekwu aka n'oge ma hụ na a rụchapụrụ ọrụ ahụ ngwa ngwa tupuu ma ọ bụ oge e kwekọrịtara na ọ ga-akụrụ ọnụ. Ọ kọwara mgbochi na nsogbu ahụ ndị obodo ahụ na-enye ha n'ịrụ ọrụ ahụ dịka ihe kacha ebi ha aka ọjọọ, ma na-adọghachikwa aka elekere azụ ọrụ ahụ. Ọ kpọkukwazịrị ọchịchị steeti Anambra ka ọ zọbanye ụkwụ ma lebara nke ahụ anya ka ya bụ ọrụ wee gaa siriri wee ruo mgbe e sepuru aka na ya.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ ''Anambra Project Monitoring & Management Office (APMMO)", Maazị Mike Obuekwe, bụ onye soro wee bịa ilete ka ya bụ ọrụ si aga kwuru ụzọ ahụ ga-eweta ezi mmepe n'obodo ahụ, ma nyekwa aka kwalite ịkọ ugbo na ibuputa ihe a kọtara n'ugbo n'okpuru ọchịchị ahụ niile.

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

Gọọmenti Anambra Ga-Akwàdo Ndị Ntorobịa Dị Puku Iri Anọ n'Ime Ahọ Anọ --- Obianọ...

Gọọmenti Anambra Ga-Akwàdo Ndị Ntorobịa Dị Puku Iri Anọ n'Ime Ahọ Anọ --- Obianọ...

Ọchịchị steeti Anambra ekwela nkwà ịkwàdo, o pekata mpe, ndị ntoribịa ruru puku iri anọ n'ime ahọ anọ na-abịa abịa, ma mekwa ka ha guzosie ike, kwụụrụ onwe ha.

Ndị Okenye Anambra Etoo Gọọmenti Etiti Maka Ikwe Nkwa Ịkwụ Anambra Ụgwọ O Ji Ya...

Ndị Okenye Anambra Etoo Gọọmenti Etiti Maka Ikwe Nkwa Ịkwụ Anambra Ụgwọ O Ji Ya...

Otu ndụmọdụ ahụ jikọrọ ndị okenye na ndị e ji okwu ha agba izu na steeti Anambra, bụ nke a maara dịka ''Anambra State Elders’ Advisory Council" etoola gọọmenti etiti maka nkwa ahụ o kwere ịkwụ steeti Anambra ego dị ijeri Naịra iri atọ na asaa n'ime ụgwọ ahụ o ji steeti ahụ maka idozigharị okporo ụzọ dịịrị ya bụ gommenti etiti dị n'ime steeti ahụ nakwa ọrụ ndị ọzọ dịịrị ya, nke gọọmenti steeti ajụ jiri ego ya wee rụọ n'ihi oke mkpa ọ dị.

Nwoke A Tụrụ Nga Mkpụrụ Ọka Amalitela Ime Nzere 'Masters' Ya Na Mahadum...

Nwoke A Tụrụ Nga Mkpụrụ Ọka Amalitela Ime Nzere 'Masters' Ya Na Mahadum...

Dịka a sị na mmasị onye adịghị anwụ n'ime ya, otu nwoke a tụrụ nga mkpụrụ ọkà n'ụlọ mkpọrọ Awka (Awka Prison) dị na steeti Anambra, bụ maazị Jude Ọnwụzulike nọrọ n'ụbọchị Monde banye n'agụm akwụkwọ 'Masters' ya na mahadum "National Open University of Nigeria' (NOUN), bụ ebe ọ ga-eme ihe ọmụmụ "Information Technology". Mmemme mbanye n'agụm akwụkwọ ya ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ogige ụlọ mkpọrọ ahụ dị n'Awka.

Ohere Ezumike: A Dụọla Ụmụakwụkwọ Ka Ha Gusie Akwụkwọ Ike; Nye Ha Nkwàdo...

Ohere Ezumike: A Dụọla Ụmụakwụkwọ Ka Ha Gusie Akwụkwọ Ike; Nye Ha Nkwàdo...

Dịka oge ohere ezumike na-agawanye n'ihu ugbu a, a kpọkuola ma dụọ ụmụ akwụkwọ ka ha were ya bụ ohere ọma gụọ ọtụtụ akwụkwọ ma mụta ọtụtụ ihe ga-enyere ha aka na ndụ, karịa igwufusi ya n'egwuregwu ma ọ bụ n'ịkpa ọfoogeri, bụ nke enweghị ihe ọbụla ọ ga-agbàkwụnye na ndụ ha.

Anambra Ga-Eso Rita Uru n'Amụmà Egọ Ọrụ Mmepe Ụlọ Ọba Ego Mba Ụwa...

Anambra Ga-Eso Rita Uru n'Amụmà Egọ Ọrụ Mmepe Ụlọ Ọba Ego Mba Ụwa...

E meela ka a mara na steeti Anambra ga-esonye na steeti ndị ga-erita uru n'amụma ego ọrụ mmepe ime ime obodo, bụ nke sitere n'aka ụlọ ọba ego mba ụwa.

Obianọ Na Nwunye Ya Emee Ncheta Ọgbụgba Ahọ Iri Atọ Ha Jiri Lụọ Di Na Nwunye...

Obianọ Na Nwunye Ya Emee Ncheta Ọgbụgba Ahọ Iri Atọ Ha Jiri Lụọ Di Na Nwunye...

Oke ọñụ dara nnọọ ụbọchị ụka dịka aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ na ọmarịcha nwunye ya bụ oriakụ Eberechukwu Obianọ mere mmemme icheta na ọ gbaala ahọ iri atọ kpọmkwem ha jiri malite ibi dịka di na nwunye.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.