Ji Ọhụụ: Ndị Obosi Emeela Emume Obiọra

Ji Ọhụụ: Ndị Obosi

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Oke ọñụ dara nnọọ n'Obosi dị n'okpuru ọchịchị Idemili North merùbèrè otu oke mmemme e jiri mara ha, bụ nke a kpọrọ Emume Obiọra nke ahọ 2019, ma bụrụkwa nke ha na eze ọdịnala ha ji emerube mmemme mmalite igwupụta na iri ji ọhụụ n'obodo ahụ.

Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ọgbọ Afọr Adike Obosi, ma bụrụkwa nke ndị ntorobịa obodo ahụ buru ụzọ were egwu ọdịnala gbagharịa na mpaghara ebe dị iche iche n'obodo ahụ, iji mee ka ndị mmadụ mara maka ya, ma sikwa n'ụzọ dị otu ahụ mee ka ebe niile kpòghara ọkụ, tupuu e wee malite ya bụ mmemme.

N'okwu ya bànyere nke ahụ, eze ọdịnala Obosi, bụ Igwe Chidubem Iweka kọwara na ya bụ mmemme abụghị naanị oge iji kwanyere ji ùgwù dịka eze ihe a kọrọ n'ugbo, kama na ọ bụkwa oge a na-eji egosipụta ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo, ma bụrụkwa oge ndị Obosi na-eji anọkọ ka ụmụnne, ma na-eme ka udo tọtọ àtọ gaa n'ihu iguzosi ike na ya bụ obodo.

O mere ka a mara na ndị mbụ na ndị egede Obosi, bụ ndị nna nna ha hụtara mkpà ọ dị na ha mère ka oge emume Obiọra bụrụ oge e ji akwàlite udo na ịdịnotu, ịhụnanya nakwa ime obi nwanne, bụzị nke mere iwu ha jiri wee màchie mmadụ itinye aka n'ihe ọbụla bụ ịkọ ọnụ ma ọ bụ ịlụ ọgụ n'ụdị ọbụla, oge ọbụla a na-eme mmemme ahụ.

N'okwu nke ya, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kelere ndị obodo ahụ maka otu ha si esonyesi ike n'ịkwàlite njirimara na omenala Ndị Igbo site n'imerùbe mmemme dị iche iche e si na ya egosipụta ma na-akwàlite ịma mma nke ọnatarachi ndị Igbo, ma kpọkùkwazie ha ka ha jide ka ha ji.

O metụsịrị aka n'ọtụtụ ige dị iche iche ọchịchị ya mepụtagòro n'ime ka ngalaba niile nke steeti hụ bụrụ èji ama atụ, ma kpọkukwazie ndị Obosi ka ha na-àkwàdo eze ọdịnala n'ezi ọrụ ya idu obodo ahụ, ọbụnadị dịka ọ kpọkùkwàrà ndị arụrụ ala, ndị ohi na ndị ọzọ na-ebute ala adịghị mma ka ha kwakọrọ ngwongwo ha pụọ na steeti ahụ, n'ihi na ohere adịrịghị ha.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi ọchịchị 'Obosi Development Union' (ODU), bụ Maazị Ike Okolo mere ka a mara na mmemme Obiọra bụ omenala dịbara gboo n'obodo ahụ, ma bụrụkwa nke na-echetara ha uru ọ dị, bụ ibikọ ọnụ n'udo na n'ịdịnotu dịka otu ndị, ma sịkwa na ya bụ mmemme bụkwa nwata tote o tokwuru, n'ihi na ọ bụ n'aka ndị nna nna ha ka o siri wee rute ha aka.

Oke mmemme ahụ bụ nke dọtara ọtụtụ ụmụ afọ obodo obosi, ma ọ nọ n'ụlọ ma ọ nọ n'ụzọ ije, bụ ndị sitere ebe dị iche iche wee bịa iji anya ha gbara ekeresimeesi, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nabata, ma nye nkwanye ugwu nyegara ụfọdụ ndị mmadụ dị iche iche, nke gụnyere Minista ntà na-ahụ maka gburugburu, bụ Oriakụ Sharọn Ikeazọr, tinyere Oriakụ Uche Ekwunife, bụ onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra Etiti n'ụlọ omebe iwu sineeti, na ụfọdụ ndị ọzọ.

N'okwu ha n'otu n'otu, Onoowu obodo Obosi, bụ Collins Anibọgwụ; onyeisi oche òtù 'Nigerian Medical Association' ngalaba ya nke steeti Anambra, bụ Dọkịta Ndụdị Mụọnagọ, tinyere onyeisi òtù 'Enyinwaanyị Obosi' bụ Dọkịta Vivian Ọnwụekwe bùnyere Igwe Iweka maka ime ka Emume Obiọra na-agawanye n'ihu ma na-ekpòwanye ọkụ karịa ka ọ dị na mbụ, ya na inwògharị ya ka ọ bụrụzie ihe nkwàlite njem nlegharị anya n'obodo ahụ.

A nọrọ na mmemme ahụ wee gbaa egwu ọdịnala dị iche iche, nke gụnyere ùhìè na Ịkpọ Ọnụnụ; ma nọrọkwazie na ya wee buoro eze ọdịnala ahụ ìhù site n'aka ndị otu dị iche iche n'obodo ahụ, nakwa ndị siri ebe dị iche iche bịa isonye na ya bụ oke emume.