Ala Naịjirịa ekpebigo ịkwụsị ịkpa oke megide ụmụ nwanyị

Ahu Ike
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Gọọmenti ala Naịjiria ekwuputego mkpebi ya maka ịkwụsị kpam kpam akparamagwa ọ bụna na-ewete mmegbu ma ọ bụ ịkpa oke megide ụmụ nwanyị. A na-agba mbọ ịhụ n’iwu na usoro ọchịchị nke ala Naịjirịa gbadoro ụkwụ n’iwu na usoro ọchịchị nke mba ụwa gbasara ọnọdụ ụmụ nwanyị.

Gọọmenti ala Naịjiria ekwuputego mkpebi ya maka ịkwụsị kpam kpam akparamagwa ọ bụna na-ewete mmegbu ma ọ bụ ịkpa oke megide ụmụ nwanyị. A na-agba mbọ ịhụ n’iwu na usoro ọchịchị nke ala Naịjirịa gbadoro ụkwụ n’iwu na usoro ọchịchị nke mba ụwa gbasara ọnọdụ ụmụ nwanyị. Onye minista na-ahụ maka mmepe na agam n’ihu ụmụ nwanyị, bụ Zaniab Maina, kwuputere nke a n’Abuja.

Maina kwuru si na na-agbanyeghị n’ala Naịjirịa na-agbalị n’ihe gbasara ịnye ụmụ nwanyị oke nke ruuru ha, a ka nwere ọtụtụ ọlụ e kwesiri ịlụ n’ịnye ụmụ nwanyị ezigbo ọnọdụ obibi, yana ịkwụsị mmegbu na ịkpa oke megide ụmụ nwanyị.

Maina gbakwụnyere na ya nwere olile anya na Naịjirịa ga-abụ obodo ebe ịkpa oke na-adịghị, ebe ụmụ nwanyị ga na-enwete ezigbo agụm akwụkwo, na-ekwu uche ha, ma na-esonye n’usoro ọchịchị obodo, na-enweghị ịkpa oke ọ bụna megide ha.