Anyị Agaghị Ekwe Ka E Gwuo Ojoro Ọbụla na Nhọpụta Anambra --- Ndị Ahịa

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Otu jikọtara ndị ahịa na steeti Anambra bụ AMATAS n'aha mkpirisi na nke jikọtara ndị ahịa na mpaghara ọwụwa anyanwụ ala anyị bụ SEAMATA ekworona ntutu taa ma kpebie na ha agaghị ekwe ka e nwee ihe ọbụla bụ igwu ojoro n'ụdị ọbụla na nhọpụta ọchịchị na-abịa n'ihu na steeti ahụ, site n'aka mmadụ ọbụla ma ọ bụ otu ọbụla.

Onye isi ndị otu a bụ maazị Okwudịlị Ezenwankwọ mere ka a mara nke a ụbọchị Tọzdee oge ndị otu jikọrọ ndị na-arụpụta akpụkpụ ụkwụ na Anambra bụ SMAAS bịara kpọtụrụ ya n'isi ụlọ ọrụ AMATAS dị n'Ọnịcha, na steeti Anambra.

O kwuru na ewezuga igwu ojoro, aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ nwere ezi ohere dị elu ituru ugo na ya bụ nhọpụta na-abịa n'ihu, n'ọnwa Nọvemba ahọ a.