Buhari Ji Ala Naijiria n'Ọrụ -- Ndi Na-eme Ngagharị Iwe

Nchekwa Obodo
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ndi otu na-eme ngagharị iwe ma na-akpọkwa oku ka onye isi ala bụ Muhammad Buharị chighata malite ọrụ ma ọ bụ gbaa alụkwaghị m, ekwuputana na ya bụ onye isi ala ji ala Naịjiria n'ọrụ nke ukwu. Ndi otu ahụ kwuru na Buharị, bụ onye hapụrụ ala Naịjiria gaba ịnara ọgwụgwọ na mba Lọndọn kemgbe ihe karịrịṅ ụbọchị iri itoolu gara aga akpụọla ọnọdụ akụ na ụba nke ala anyị afọ n'ala ma meekwa ka ihe niile kwụrụ agaghị aga.

Ha sịrị na osote onye isi ala bụ Maazị Yemi Osibanjọ, bụ onye ka jigodi ọkwa dịka onye isi ala kemgbe ọnwa atọ enwebeghị ike ime ihe ụfọdụ, bụ ihe ndi dịịrị onye isi ala ime, ma kpọkuokwa ụmụ ala Naịjiria ka ha doo gwa ya bụ nwoke ka ochighata malite ọrụ ma ọ bụ gbaa alụkwaghị m, ka ala Naịjiria wee gaa n'iru.