Chi-ojoo emegooro mmadu 60 n’Abijan

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ọnwụ ike egbuona ihe ruru mmadụ 60 n’obodo Abijan na mba Kotovua.

 Ka a na-eme mmeme ịchụ afọ, igwe mmadụ gbakọtara na mpaghara obodo ahụ ebe a na-amụ ọkpụpka ọkụ fireworks. Onye mịnịsta n’ahụ maka ime obodo, bụ Hamed Bakayoko, kwuru na mmadụ 60 nwụrụ anwụ, ebe mmadụ 49 ndị ọzọ merụrụ ahụ.

Onye isi ala Kotovua, bụ Alassane Ouattara, ejego ebe ahụ ihe mberede a mere, kwee nkwa na ha ga-achọpụtarịrị otu ihe chi-ọjọọ ahụ siri mee.

Anyị nụtara na, ka a mụchara ọkpụkpa ọkụ fireworks ahụ, ndị mmadụ malitere ịlaghachi be ha ebe elekere mbụ nke isi ụtụtụ. Mmadụ karịrị akarị na Plateau, ebe e mere ihe nkiri ahụ. A malitere gbawa igidi, nke mere ndị mmadụ jiziri dagbuwe ibe ha. Ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ bụ ụmụ-nwanyị na ụmụ-aka.