Clement Uwaifo amalitela ọrụ dịka ode akwukwọ ukwu nke ngalaba ọrụ ahụ ike

Oru Aka
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Osarenoma Clement Uwaifo amalitela ọrụ dịka ode akwụkwọ ukwu, nke a na-akpọ Permanent Secretary n’olu bekee, nke ngalaba na-ahụ maka ahụ ike nke ala Naịjiria.

Maazị Uwaifo weghara ọrụ n’aka Hajiya Binta Adamu Bello, bụ onye lara ezumikenka dịka, ka ọ rụchara ala Naịjiria ọrụ afọ iri atọ na ise.

Uwaifo bụ otu onye n’ime ndị onye isi ala Naịjiria, bụ Muhammadu Buhari, họpụtara ka e me ha ndị ode akwụkwọ ukwu. Tupu ahọpụta yam aka ọkwa ahụ, Maazị Uwaifo jibu ọkwa dịka onye ndu (Daịrektọ) nke na-ahụ maka ọnọdụ mmiri ọṅuṅu nan gala ahụ ike.

Maazị Uwaifo gwara ndị ọrụ ngalaba ahụ ike ka ha kwado ya, iji mee ka ọnọdụ ahụ ike kawanye mma n’ala Naịjiria.