DANA Air amalitego imekwa njem ozo na Nigeria

Njem
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ka o mechara ọnwa asatọ otu ụgbọ-elu ha kpọkasịrị na Iju-Ishaga, were gbuo mmadụ 160 na Lagos, ndị Dana Air amalitekwana ime njem ọzọ n’ala Nigeria.

Ka ihe mberede ụgbọ-elu ahụ mechara n'abalị atọ nke ọnwa juunu afọ 2012, gọọmenti ala Nigeria na ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọ-elu napụrụ ndị Dana Air akwụkwọ ikike ife ụgbọ-elu.

Onye minista na-ahụ maka njem ụgbọ-elu na Nigeria, bụ Stella Oduah, enyeghachigo ndị Dana ikike ịmalite kwọwakwa ụgbọ-elu. Ọnụ na-akwuru ndị ụlọ-ọrụ Dana Air, bụ Tony Usidamen, kwuru na gọọmenti enyeghachigo ha ikike ịmalite ọrụ.

Ụgbọ-elu izizi ha, kemgbe ọnwa asatọ, 9J353, hapụrụ ọdụ-ụgbọ-elu Murtala Muhamed na Lagos jewe Abuja n’ụtụtụ Fraịdee.