19
Sat, Oct
23 New Articles

E gbuola mmadụ 45 na Steeti Nasarawa

Nchekwa Obodo
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ozi anyị nwetere site n’aka ndị Guardian nke ala Nigeria na-ekwu na tigbuo zọgbuo na-ada n’etiti ndị obodo Eggon na ndị Gwandere na Steeti Nasarawa. Anyị nụrụ na e gbuola mmadụ iri ano n’ise n’agha ahụ agbụrụ abụọ ndị a na-ebuso onwe ha. Anyị nụrụ n’agbụrụ abụọ ndị a na-azọ ala.

Mana ụfọdụ ndị nta akụkọ na-ekwu na ịhe na-ese okwu bụ mmeri ahụ Umaru Tanko Al-Makura nwetere, nke mere ka ọ lọghachite n’ọkwa ọchịchị. Gọvanọ Al-Makura, onye Gwandere, na Sinetọ Solomon Ewuga, onye Eggon, na-ese okwu, nke mere Sinetọ Ewuga na ndị na-eso ụzọ ya jiri hapụ APC banyezie na PDP. Ndị Guardian nwetere ozi na mba abụọ ndị a jiri ngwa agha gụnyere AK 47 egbu onwe ha.