19
Sat, Oct
23 New Articles

EFCC ekonukoola Soludo

Nchekwa Obodo
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ndị EFCC, ngalaba na-ahụ maka ịchụ nrụrụ-aka na iri-ngo ọsọ na Nigeria, jidere onye bụbu onye isi oche ụlọ ọba ego etiti, Charles Soludo, ụnyahụ bụ Tọzdee.

Ndị EFCC nwudere Soludo n’ebe o bi n’Abuja. Gịnị ka Soludo mere e ji achụ ya? Anyị nụrụ na ọ ga-abụrịrị ihe gbasara ọrụ ngo ahụ Soludo nyere otu ụlọ-ọrụ si mba Australia maka ibipute akwụkwọ ego polima. Soludo nyere ndị Australia ọrụ a mgbe ọ ka ji ọkwa dịka onye isi oche ụlọ ọba ego etiti.

Ndị EFCC jidekwere ihe ruru mmadụ 12 ndị ọzọ ọkwa ha gbagoro agbago na CBN, ndị a na-enyocha enyocha maka nrụrụ aka n’ihe gbasara inye ọrụ maka ibipute akwụkwọ ego polima, oge Soludo ka nọ n’ọkwa.

Anyị nụrụ na EFCC dị njikere ịgba Soludo na ndị ọzọ ahụ akwụkwọ n’ụlọ-ikpe.