Egbuola mmadụ abụọ ndị Boko Haram na Kano

Nchekwa Obodo
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ndị Channels Television na-akọwa na mmadụ abụọ ndị otu Boko Haram anwụọla na Steeti Kanọ. Nke a mere ka ndị uwe ojii na ndị soja bagidere otu ebe mgbaba ndị otu ahụ n’ụbọchị Satọdee. Ụgbọala ndị Boko Haram ahụ kwara ogbunigwe nay a gbawara were gbuo mmadụ abụọ ndị ahụ. Ogbunigwe ahụ merụrụ mmadụ abụọ ndị soja ahụ.

Otu onye n’ime ndị soja ahụ jere wakpo ogige ebe ndị Boko Haram ahụ zoro na Kano, bụ Brigadier general Iliyasu Abbato, gwara ndị nta akụkọ na ihe a mere ihe dika ebe elekere mbụ nke isi ụtụtụ n’ụbọchị satodee. Ọ sịrị na ndị out Boko Haram ahụ jiri aka ha gbawaa ogbunigwe ha kwara n’ụgbọala ha mgbe ndị uwe ojii na ndị soja wakporo ha na obodo Sabuwar Gandu nke nọdebere Kano nso.