19
Sat, Oct
23 New Articles

Evans Awụchaa n'Ụlọ Ikpe

Ndu Mmadu
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Nwa amadi ahụ na-ewi ewi n'ihe gbasaara ịtọrọ mmadụ, bụ maazị Chukwudumeme Onwuamadike, onye e ji Evans mara, nọrọ n'ụbọchị Wenezdee wee wụchaa n'ụlọ ikpe ukwu dị n'Ikeja Legoosị maka ịzara ọnụ ya n'ihe dị iche iche e kwuru megide ya.

Ya bụ agụ nwoke bụkwannọọ onye nọ n'ụbọchị ahụ n'ụlọ ikpe ahụ wee wedachaa onwe ala kpamkpam, ma kwuwaakwa hooha na ikpe mara ya, dịka a na-agụpụtasị ihe ahụ dị iche iche gọọmenti steeti Legoosị wetara megide ya, bụ nke e jiri wee kpee ya ikpe.

Ọbụnadị ndị ọrụ nchekwa dị iche iche, bụ ndị kekpọkwara onwe ha nke ọma, juputara n'ụlọ ikpe ahụ nakwa ogige ya niile.