Goodluck Jonathan ezigagooro onye isi ala Ijipt a hoputara ohuru ozi nkwado

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ozi anyị nwetere n’aka ndị Voice of Nigeria na-ekwu na onye isi ala Nigeria, bụ Goodluck Jonathan, ezigagooro Dr Mohamed Morsi ozi nkwado. Na ntụlị aka izugbe nke e mere na mba ahụ na nso a, ndị Ijipt họpụtara Morsi ka ọ chịrị ha gawa.

N’ozi nkwado ya, Jonathan kọwapụtara mmeri a Morsi nwetere dịka nke tọrọ atọ. Ọ gbakwụnyere na ntụli aka ahụ e mere bụ nnukwute ihe iriba ama na mba Ijipt. Lee otu Jonathan siri kwu ya na bekee:

“I write to offer my warmest congratulations on your election as President of the Arab Republic of Egypt. The election in which you triumphed, the culmination of a long process of political transition marked an important milestone in the history of modern Egypt. Your success in the keenly contested election is well deserved and is a just reward for your tenacity, courage and vision.’’

Jonathan gwara Morsi na ya bụ Jonathan na-atụ anyị ikwalite ọnọdụ mmekọrịta enyi na enyi, bụ nke dị n’ekiti ala Nigeria na mba Ijipt.