Gọọment Steeti Anambra Ga-Arụ Ụzọ Ahụ Si Amanasaa Gaa Ụmụọmakụ

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Gọọment steeti Anambra ga-enyefe amụma ọrụ ngo maka irụ ụzọ awara awara ahụ si Amanasaa gaa 'Girls Seondary School' wee pụta Ụmụọmakụ, n'ahọ ọzọ.

Gọvanọ Willie Obianọ kwuputara nke a ụbọchị ụka gara n'aja maasị dị nsọ nke weere ọnọdụ ụlọ ụka St. Paul (Katọlik) Achala-Ụmuchu nke dị n'okpuru ọchịchị Agụata na steeti Anambra.

Ka ọ na-ekwputa na ọrụ na-aga n'ihu n'ụzọ nke siri Nkwọ-Umuchu gaa Achala-Umuchu, Gọvanọ Obianọ kwukwara na e nyego ọrụ ngo nke ịrụgharị ụlọ ọgwụ ọhaneze dị n'Ụmuchu, bụ nke ọ sị na o so n'otu n'ime ụlọ ọgwụ a ga-eji wee rụọ ọrụ amụma 'Health Insurance Scheme' nke steeti ahụ.

O kwuputanworo njikere ọchịchị ya dị ịkwalite ezi obobi ndụ na ọdịmma nke ndi Anambra, ọkachasị ndi bi n'ime ime obodo.

Ọ nọzịkwara n'oge ahụ rịọ ndi obodo ahụ ka ha gaa n'ihu n'inye ọchịchị ya nkwado iji wee ga n'ihu n'ọrụ ọma o ji n'aka na steeti ahụ.

N'ozi nnọọ ya n'ofufe nru ahụ pụrụ iche, onye Bishọp ụka Katọlik na Dịọsis Awka, bụ Bishọp Paulinus Ezeokafor kelere gọọmenti steeti Anambra na mbọ ya niile n'iwunye ihe dị iche iche na-akwalite ọnọdụ obibi ndụ na ọnọdụ mmụta n'obodo a na n'ụlọ akwụkwọ dịgasị iche iche na mpaghara ahụ, ma rịọziekwa ụmụ akwụkwọ ka ha gbado anya n'ịgụ akwụkwọ ha.

Bishọp ahụ chetekwaara ndi otu Kraịst mkpa ọ dị igosipụta omume ezi onye otu Kraịst!, inwe nnagide nakwa igosipụta ụdịdị nke Kraịst n'ihe niile ha na eme.

A nọzịrị n'ikpe azụ n'ofufe nru ahụ wee nye Gọvanọ Willie Obianọ onyinye akwụkwọ ukwe dị iche iche site n'aka onye ụkọchukwu nke ụlọ ụka ahụ.