Gọọmenti Bornu na-agwa ndị gbara ọsọ ọgụ ka ha wetuo obi ha ala

Nchekwa Obodo
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Gọọmenti Steeti Bornu na-adọ ndị niile ahụ gbara ọsọ ọgụ Boko Haram na steeti ahụ aka na ntị ka ha wetuo obi ha ala maka ịlọghachi be ha. Mgbe ahụ ndị Boko Haram wakporo obodo dị iche iche na Bornu, ọtụtụ ndị mmadụ gbara ọsọ ọgụ. Ugbu a, ndị agha nke Naịjiria na-enwete mmeri, na-achụpụzị ndị Boko Haram n’obodo ndị ahụ. Ọtụtụ ndị ahụ gbara ọsọ ọgụ amalitego laghachiwe be ha.

Gọọmenti steeti ahụ na-akpọ ndị dị otu a ka ha were ya nwayọ; ka ha kpachara anya ha. Onye kọmishọna na-ahụ maka ebe obibi, yana ọkụ latrik, bụ Haruna Mishelia, gwara ndị nta akụkọ na Maiduguri, na gọọmenti na-adọ ndị niile na-alọghachị aka na ntị maka na a na-atụ ụjọ na, tụpụ ha bọrọ ọsọ, o nwere ike ịbụ na ndị Boko Haram liri mgbọ ogbunigwe n’ebe ndị iche iche.