Gọọmenti Canada ga-enye ndịda-anyanwụ Afrịka ọgwụ mgbochi ebola

Amerika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Gọọmenti mba Canada ekwuela na o ge-enye otu puku ọgwụ e ji eme ntule ọgwụgwọ nje ọrịa ebola, iji nye aka gbochie ndapụta ọrịa na mpaghara ndịda anyanwụ Afrịka. O mere mkpebi a ka ụlọ ahụike mba ụwa bụ World Health Organisation kwuputere na o ziri ezi iji ọgwụ a na-ejibeghị gwọọ ọrịa iji gwọọ ndị na-arịa ọrịa ebola.

Ndị ọkachamara n’okwu ahuike emeena ka a mara na ikesa ọgwụ mgbochi na ọgwụ ime ntule ọgwụgwọ ebola a kpọrọ Zmapp adịghị ọtụtụ ebe ọ ga-ewe ọtụtụ ọnwa iji rụpụta ọtụtụ ọgwụ a.

Mkpụrụ-ọgwụ Zmapp bụ nke e nyere mmadụ abụọ ndị ọrụ arụike mba United States gosiri na a na-enweta ọga n’iru na ebe arụike ndị a nọ.