Gọvanọ Obianọ Enyena Ego Dị N258.5m Maka Ụlọ Ọgwụ Ndi Ụka

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie enyefeena ego dị narị nde naịra abụọ, iri ise na asatọ na ụma ise (N258.5m) maka iji wee kwalite ụlọ ọgwụ ndi ụka dịgasị na steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ nyefere ya bụ akwụkwọ ịdọrọ ego (cheque) ụbọchị Mọnde na mmemme nke weere ọnọdụ na Ọkammụta Dọra Akụnyili 'Women Development Centre' dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Ndi ụka Katọlik ka o nyere ego dị otu narị nde Naịra, iri ise na iteghete, na ụma ise (N159.5m), ebe ndi ụka Anglican na ụka ọgbara ọhụụ (Pentikostal) nwetara nde Naịra iri asatọ na anọ (N84m) na nde Naịra iri na ise (N15m) n'otu n'otu.

Ka ọ na-enye ha akwụkwọ ịdọrọ ego (cheque) ahụ, Gọvanọ Obianọ kwuru na e kesara ego ahụ dịka usoro ọnụ ọgụgụ ụlọ ọgwụ ndị ụka ọbụla nwere dị, dịka iwu siri kwuo, nakwa ole ike ha ra, dịka o si pụta ihè n'amụmà ego ọrụ steeti ahụ, nke ahọ 2017. Ọ rịọzịkwara ụlọ ọgwụ ndi ụka nwe, ndi na-esoghị keta ego nke ahọ a, ka ha zite ihe ghasaara, ka ha wee bata n'amụma ego ọrụ steeti ahụ nke ahọ na-abịa.

Gọvanọ Obianọ kwuru na ọchịchị ya ekeena ego ịgbata ọsọ enyemaka nke ngalaba ahụ ike na steeti ahụ ụzọ atọ, nke bụ: iwulite akụrụngwa e ji akwalite ọnọdụ ahụ ike, ịhụ na ndi ọrịa nwetere nkasi obi na ezi nnọzite, nakwa inye ndi ọrụ nkụzi, ijigide ha na ịhụ maka ezi ọnọdụ obibi ndụ ha. Ọsịkwazị na nke ahụ so n'otu n'ime mbọ ọchịchị ya na-agba ịhụ na e nwere ezi nnwogharị pụrụ iche na ngalaba ahụ ike na steeti ahụ.

Na mbụ n'okwu ya, onye Kọmichọna na-ahụ maka ahụ ike na steeti ahụ, bụ Dọkịnta Josephat Akabuike kwuru na ịgba ahụ ọchịchị nọ ugbua tigoro na ngalaba ahụ ike ahụ bụ iji wee webata mgbanwe dara ụda n'ebe ọnọdụ ahụ ike na inye ọgwụgwọ dị.

Dọkịnta Akabụike kpọpụtara ihe dịgasị iche iche ọchịchị nọ ugbu a megoro na ngalaba ahụ ike, nke gụnyere iwebata atụmatụ 'State Health Insurance Scheme', Ịkwalite amụma 'State Primary Healthcare', Iwube ụlọ ọrụ 'State Integrated Emergency Management Services', Inyegharị ndi ụlọ ọgwụ asambodo, tinyere ihe ndi ọzọ ha mepụtagoro.

N'aka nke ya, onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara ọrụ ugbo, njem nlegharị anya, inye ọzụzụ na ọnọdụ gbanụ gbanụ, bụ 'Venerable' Amaechi Okwuosa kwuputara hoohaa na Gọvanọ Obianọ egosipụtana n'ebe a hụrụ anya, na ọ bụ nwoke na-adịghị akpa oke n'opukperechi, ma sịkwa na e wezuga mmemme ndi ọzọ, na ya bụ Gọvanọ na-esonyesi ike na mmemme na ọgbakọ dị iche iche ndi ụka na-emegasị na steeti ahụ, ma na-akwalitekwa mmelọrịta nke okpukperechi dị iche iche n'ala Naịjiria.

N'ozi ekele ha n'otu n'otu, onye Archbishop 'Metropolitan, Ecclesiastical Province' nke Niger, bụ 'Most Reverend' Christian Efobi, nke onye nọchitere anya ya bụ 'Venerable' David Obiagboso; onye 'Archbishop Metropolitan, Onitsha Catholic Archdiocese' bụ 'Most Reverend' Valerian Okeke, nke onye nọchitere anya ya bụ 'Auxiliary Bishop' nke Dịọsis Awka, bụ 'Most Reverend' Jonas Benson Okoye, tinyere onye nnọchite anya nke otu jikọtara ndi ụka Pentikostal n'ala Naịjiria, kelere Gọvanọ Willie Obianọ maka mgbata ọsọ ya na mbọ niile ọ na-agba iji kwalite ọnọdụ obibi ndụ ndi Anambra, ma kwe nkwa iji ego ndi ahụ wee rụọ ọrụ e jiri weta ha.