Govano Rochas Okorocha ezigagoro Adams Oshiomole ozi iti aka n’obi

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ozi anyị siri n’aka gọọmenti Steeti Imo nwete na-ekwu n’aka na-achị Steeti Imo, bụ Rochas Okorocha, ezigagoro onye ogbo ya, bụ Adams Oshiomole, aka na-achị Steeti Edo, ozi iji tie ya aka n’obi maka ihe mberede okporo ụzọ ahụ dakwasịrị ndị otu ya n’ụzọ e si aga Auchi. Na ngwụsị izu ụka a gara aga, ihe mberede okporo ụzọ dakwasịrị ụgbọala ndị na-etiri Oshiomole mkpu n’ụzọ Auchi.

Mmadụ atọ ndị nta akụkọ so ndị otu Oshiomole eme njem tufuru ndụ ha. A na-akọwa na otu ụgbọala gwongworo nyahiere aka, were makwuru, ma kurie ụgbọala oti mkpu Gọvanọ Oshiomole, were gbuo mmadụ atọ ndị nta akụkọ.

Ndị nta akụkọ ndị ahụ bụ ndị na-arụrụ AIT na ITV. Ụlọ mgbasa ozi ndị ahụ họpụtara ndị nta akụkọ ahụ ka ha na-eso Oshiomole. Rochas Okorocha zigakwaara ndị AIT, ITV na NUJ ozi iti aka n’obi maka ọnwụ ndị nta akụkọ a.