Ịbu agha megide mpụ na aghụghọ

Afrika
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Onye isi ụlọ-ọrụ n’ahụ maka ibu agha megide mpụ na aghụghọ bụ EFCC n’aha ịchafụ, ekwuola sin a, n’enweghị ịsọ anya ọbụna, ụlọ ọru ya na-agba mbọ ibu agha megide nrụrụ aka. O kwuru nke a mbe O jere n’isi ụlọ ọrụ na-ahu maka mmepụta akwa na ngwa E ji akwa ya nke A kpọrọ [NUTGTWN] n’aha nkpirisi na Kaduna.

Magu gara n’ihu kwuo na onye isi ala bụ Muhammadu Buhari nyere ha ikikere inyocha nwafọ ọbụla n’agbanyeghị otu ndọrọ ndọrọ, iji hụ na E meriri mpụ na arụrụala.

“Anyị nwere ike ịnyocha, ma n’enyochakwa ndị ji ọkwa gọọmenti ugbua na-emeghị ka ha mara. Echeghị m na Ọ bụ nanị maka imegide mpụ, kama agha mmegide mpụ ka E mere maka iji nwe ntụkwasị obi n’ọnọdụ akụ na ụba, makwa ịkpọbata ndị nwere mmasị ịbịa guzobe ụlọ ngwa ahịa n’ala Anyị.

Na mbido, ode akwụkwọ otu ndị mmepụta akwa bụ comrade Issa Aremu kwuru mkpa Ọ dị ibu agha megide mpụ. O kwuru n’agha abụghị nanị nke A ga-ahapụrụ ndị EFCC, ICPC na ndị uwe ojii.

Aremu gakwara n’ihu kwuo na Ọ bụ mpụ mere na ọtụtụ steeti enweghị ike ịkwụ ụgwọ ọnwa. Ọ kpọkuru onye isi ala ka O leba anya n’ihe E kwekọtara n’ọgbakọ ezumezu nke afọ 2014 ka E nwe ike ibu agha megide mpụ.