19
Sat, Oct
23 New Articles

Igbusi Mmadụ Abughị Omenala Ndi Igbo -- Nnamdị Kanụ

Nchekwa Ala Igbo
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Onye ndu nke ndi otu Indigenous People Of Biafra(IPOB) bụ maazị Nnamdị Kanụ ekwuona hoohaa n'ebe o doro anya, na igbu mmadụ esoghị na omenala e jiri mara ndi Igbo.

Ya bụ onye ndu ndi otu ahụ kwuputara nke a ka ọ na-akatọ kpamkpam mgbusi ahụ e gbusiri ndi na-akara onwe ha ụka n'ọzụbụlụ ụbọchị ụka gara aga site na aka ndi amaghị ndi ha bụ.

 Ọ nọkwara n'oge ahụ kwuo hoohaa na o dochaghị anya etu ndi uwe ojii siri mee nyocha nke ha ọsọsọ ma tie aka n'ike sị na ọ bụ nsogbu dapụtara n'etiti ụmụ afọ Ọzụbụlụ bi na mba ofesi kpatara njinji ahụ jiri.

Maazị Kanụ kpọkuzịrị ndi ọ dị n'aka ka ha mee nnyocha ghe anya oghe banyere ajọ ọnọdụ ahụ ma gbalịakwa hụ na anwụchikọrọ ndi kpara ya bụ arụ.