19
Sat, Oct
23 New Articles

Ọba Akwụkwọ Anambra Na SSDO Emerùbe Ụbọchị Nwata Nwaanyị Na Mba Ụwa

Afrịka
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

A kọwaala mkpà ọ dị ịkwàlite ụmụaka nwaanyị ịgụ akwụkwọ nke ọma, ma kpọkwa òkù ka e bèlata otu e si emekpà ụmụaka nwaanyị ahụ na otu e si akpchapụkwa ha n'akụkụ.

Nke a bụ isi sekpụ ntị ma bụrụkwa okwu a kpụ n'ọnụ dịka ọba akwụkwọ steeti Anambra bụ 'Prof. Kenneth Dike Central E-Library' dị n'Awka, na ụlọ ọrụ 'South Saharan Social Development Organization (SSDO)' sonyeere mba ụwa n'imerùbè mmemme ụbọchị nwata nwaanyị, nke ahọ 2019

N'okwu ya na mmemme ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọ akwụkwọ 'St. Augustine Secondary School, Umuoba-Anam' n'okpuru ọchịchị 'Anambra East' nke steeti Anambra; onyeisi ọba akwụkwọ Kenneth Dike, bụ Dọkịta Nkechi Udeze kọwara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị òtu mba ụwa bụ 'United Nations' mapụtara iji wee merube ncheta nwata nwaanyị, iji kpọọ òkù ka a na-enyekwu ha ohere ọma n'ezi ihe ọbụla dịka e nyere ibe ha, nakwa iji kpọọ òkù ka e belata otu e si emekpa ha ahụ n'ihi nwaanyị ha bụ, ya na iji nyekwara ha aka iru ogoogo ha chọrọ iru n'obodo na na ndụ ha.

Ka ọ na-akọwa na oge agafeela mgbe ọba akwụwkwọ ọhaneze bụ naanị ebe a na-anọ agụ akwụkwọ; Dọkịta Udeze gara n'ihu kpọpụtasịa ọtụtụ ụzọ dị iche iche ya bụ ọba akwụkwọ ọhaneze si enyere ndị ntorobịa aka n'oge ugbu a, ọkachasị ndị nwaanyị, ma kọwaa na ihe ndị ahụ niile bụ iji kwado ha nke ọma ma nyekwa ha òhèrè ịbàra onwe ha na obodo ha úrù, ruokwa ogoogo ịkwụrụ onwe ha.

Ọ kpọkùzịrị ụmụaka nwaanyị ka ha kwete na ha pụrụ imepụta ihe dara ụdà, ma nwekwa ezi mkpebì na nkwenyesi ike na ha pụrụ iru ogoogo ọbụla ha chọrọ ịru, na-agbanyeghị nwaanyị ha bụ. Ọ dụkwàra ha ka ha ghara ikwe ka onye ma ọ bụ ihe ọbụla gbochie ha ịgawanye n'ihu n'agụmakwụkwọ ha ma ọ bụ n'ihe ọbụla ha na-eme, n'ihi nwaanyị ha bụ; n'ihi na ọ bụ site na nke ahụ ka ha pụrụ isi bụrụ ihe chi ha deere ha ịbụ, ma guzosiekwa ike ime ihe ukwu.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, mmadụ abụọ sitere ụlọ ọrụ 'South Saharan Social Development Organization' bụ Ọkaiwu Mariam Aneke na Ọkaiwu Nkem Awachie kwuru na nwata nwaanyị ọbụla kwèsiri ka e nye ya ezi òhèrè ọma ga-enyere ya aka imezupụta akaraka ya n'ụwa, ma katọọkwa otu e si akpachapụ ụmụaka nwaanyị n'akụkụ na-emekpàkwa ha ahụ site n'ịkwụsị ọtụtụ n'ime ha ịgụ akwụkwọ, ma ọ bụ site n'ịkwànye ha n'ịlụ di n'erughị eru, ebe ibe ha ndị nwoke nọ n'ụlọ akwụkwọ. Ha kwùrù na nke ahụ na-emebi ọganihu ụmụaka nwaanyị dị otu ahụ, na-ebikwa ọdịnihu ha aka ọjọọ, ma kpọọ òku ka a kwụsị ya.

Ka ọ na-tụrìsi isiokwu nke mmemme ahụ n'ahọ a, bụ "Girl Force: Unscripted and Unstoppable" nke pụtara "Ikike Nwata Nwaanyị: Edeghị Ede Na Akwụsịghị Akwụsị" onye nhazi ihe mmemme n'ụlọ ọrụ 'Development Initiative For Technology and Empowerment (DEVITEM)' bụ Oriakụ Ngọzị Osuchukwu chetaara ụmụaka nwaanyị ahụ na ikike ha nwere nakwa ihe ha pụrụ ime enweghị njedobe, ma kpọkuo ha ka ha kwenye n'onwe ha ma kwerekwa nà mmadụ ọbụla abụghị ịkwụsị ha maọbụ were aka ya deere ha ihe ha ga-abụ na ndụ, beere sọ na ha onwe ha o jiri ka ha wee kwụsị onwe ha. Ọ dụkwazịrị ha ka ha tinyesie uchu ike n'agụmakwụkwọ ha ma mụọkwa ụfọdụ ọrụ aka dị iche iche ga-enyere ha aka ịkwụrụ onwe ha, n'ihi na ọ a n'ọ bụ site n'ịdabèrè na mmadụ ibe ha ka ọtụtụ n'ime ha na-esi ama n'ọnyà ma ọ bụ daba n'aka ndị ọjọọ.

Na ntụnye nke ya, onyeisi nhàzi òtù "KIFDAYE Development and Youth Empowerment Initiative Awka" bụ Maazị Chukwuma Chukwura mere ka a mara na ụmụnwaanyị nwèrè ọtụtụ ihe ha pụrụ ịtụnye na mmepe obodo, ma e lekwasị anya n'ihe ọtụtụ n'ime ha mepụtagoro, ọbụnadị dịka ọ dụrụ ụmụaka nwaanyị ahụ ka ha ghara ikwe ka ihe ọbụla gbochie ha ịga n'ihu maọbụ ịgụ akwụkwọ.

Mmemme ahụ dọtara ụmụakwụkwọ nwaanyị sitere ụlọ akwụkwọ kọleeji iri dị n'okpuru ọchịchị Anambra East, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nye ọtụtụ nkụzi n'isiokwu dị iche iche, ọ kachasị nkuzi gbasaara adịmọcha n'ahụike, bụ nke e nyere site n'aka otu onye ọrụ ahụ ike, bụ oriakụ Geraldine Ikenwa, sitere ụlọ ahụike Mahadum Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu dị n'Amakụ Awka.