Gọọmenti ala Nigeria ga-achụ ụbịam ọsọ ụkwụ eru ala

Oru Aka
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ndị Channels Television na-ekwu na onye isi ala Nigeria, bụ Goodluck Jonathan ekwuola na gọọmenti ya nwere nkwado ịchụ ụbịam ọsọ na Nigeria. Mgbe Jonathan na-ekwu okwu n’ọgbakọ ukwu ndị otu jikọtara mba ụwa, nke e nwere na Rio de Janeiro,

Jonathan kwuru na gọọmenti Nigeria na-agba mbọ ịhụ na a na-ekewapụta ọrụ aka na ngalaba dị iche ịche, gunyere ọrụ ugbo, mmanụ akụ chi nyere, azụm ahịa, ịgbapu mmiri, na mkpocha na nzacha.

Jonathan kpọrọ ndị aka na-achị mba ụwa niile ka ha gbaa mbọ na-etinye anya n’ụzọ a ga-esi achụ ụbịam ọsọ na mpaghara ụwa dị iche iche.