19
Sat, Oct
23 New Articles

Ebe onye oso ruru ka onye ije nakwa eru

Ahu Ike
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Mbediọgụ hụrụ mụ tata na-akọsara mụ ihe ya hụrụ na-agbagwoju ya anya. Mbediọgụ sị na ya hụ ụmụ mmadụ na anụ ọhịa ka ha na-agba ọsọ ka a gasị na ha anaghị anwụ anwụ, ka ha na ezu ike, ya ajụa onwe ya sị ọ bụ gịnị na bụ nsogbu ha?

Na ya nakwa ajụ onwe ya ajụjụ sị:

Kedu mgbe anụmanụ ndị a na ụmụ mmadụ ga-ele ya anya were mụrụ akọ? Kedu ihe ya ga-emezị iji kụziere ha na nwayọ nwayọ bụ ije? Na ọ pụtara na ha enweghị echiche, ka ọ bụ na anya kpọrọ ha iji hụ na ya anaghị alụ ndụ mgbe ya na eje ije?

Ọ jụkwara mụ ma ọ bụ amaghị ihe na-eme ha? Ọ sị na ọ bụ na ha amaghị na ebe onye ọsọ ruru ka onye ije na-eru? Ọ jụrụ mụ ka ọ bụ na ha amaghị na o ji ọsọ agbakwu ọgụ amaghị na ọgụ bụ ọnwụ?

Ajụjụ ndị a tara akpụ. Ọ bụrụ na ị nwere asịsa ị nwere ịsa banyere ajụjụ ndị a, biko depute ha na ọgbakọ ụmụ Igbo bụ Igbo ka anyị gụa, were nwee ike zigara Mazị Mbediọgụ ozi, ka obi were zue ya ike.

Biko ka anyị leba anya na ndụmụọdụ Mazị Mbediọgụ, dịka o kwuru na ebe onye ọsọ ruru ka onye ije na kwa eru. Ka anyị were nụ ya ka egwu, maka na akụ fechasịa ọ dara awọ.