19
Sat, Oct
23 New Articles

Agwo na ihe o loro agbatorola

Ndụ Ndị Igbo
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ka mụ gwa gị nke bụ eziokwu. Maka na e meputazịrị egbe, dimkpa hụzịa onye ka ya, ọ ma ya ụra. Omenala ndị ọcha bụ omenaelu n’ala Igbo. Ndị a emebiela ụwa maka ngwa agha dị iche iche. Ogbu mma ga-alarịrị na nma. Ọgba egbe ga-alakwa na egbe.

Okwu a bụ okwu Igbo bụ eziokwu. Onye kpatara nkụ ahụhụ sị ka ngwere bịara ya ụgwụọ. Ndị a na-aga mba ndị ọzọ na agbarị obodo ha na agbanyeghị na ndịa bụkwa nụ ụmụ mmadụ ka hanwa.

Ihe ndị a ji tụara mba ọzọ ka a ga-ejikwa tụara ha. Mgbe mbụ ka Amerịka sị na osimiri chere ha azụ, na ọ dịghị onye ga akpatụ ha aka. Gịnị meziri ugbu a? Nkịta nazịkwa ata ọkpụkpụ a nyanyere ya n’olu.

E buru ozu onye ọzọ, ọ dị ka e bu ukwu nkụ. Mana o metụta gị n’ahụ, ị mara na ụgụrụ na atụ oyi. Ka anyị na-ekiri ndị a ndị ara sị na ha mara ihe nile. Ụwa dịrị mụ na gị na ụmụ Igbo nile mma!

Ọ bụrụ na Chineke echeghị obodo, na efu ka ndị nche na eche. Mmadụ abụghị Chukwu. Ndị ọcha abụghị Chineke. Agwọ na ihe o loro agbatọrọla, kpọm kwem!