19
Sat, Oct
23 New Articles

Di na nwunye ndi Toronto anwuona na Florida

Amerịka
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

E butere ozu mmadụ abụọ ndị Canada na Hallandale na Florida. David Pichosky, dị afọ 71, na ori-akụ ya, Rochelle Wise, afọ 66, nwụrụ n’ụlọ ha na Hallandale, obere obodo dị n’ekiti Miami na Fort Lauderdale.

E butere ozu mmadụ abụọ ndị Canada na Hallandale na Florida. David Pichosky, dị afọ 71, na ori-akụ ya, Rochelle Wise, afọ 66, nwụrụ n’ụlọ ha na Hallandale, obere obodo dị n’ekiti Miami na Fort Lauderdale. Ihe a mere n’ụbọchị Tọzdee.

Ha na-adịkawa agbada na Florida n’oge ụgụrụ winta.

Gịnị gburu di na nwunye a? Ndị uwe ojii na  Hallandale sị na otu onye agbata-obi di na nwunye ahụ jere na be ha ilete ha, were chọpụta na ha anwụgo. Ya na ha nwere oyiyi ije rie nri. Mgbe oge ruru, ọ hụghị ha. Ọ kpọrọ ha n’ekwe nti, mana ha azaghị. Mgbe o jeziri na be ha, ihe ọ hụziri bụ nanị ozu ha.

Ndị uwe ojii ka na-eme nnyocha maka ịchọputa ihe gburu mmadụ abụo ndị a.