Top Stories

Ndị obodo Ojoto dị n'okpuru ọchịchị 'Idemili South' agbapeela okporo ụzọ ọhụụ ha rụrụ, bụ nke na-azabụ okporo ụzọ St. Barnabas, ma bàgharịzie ya aha ka ọ bụrụzie okporo ụzọ "Eze Oranyelu''.

Aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ akpọkuola ndị Igbo n'ụwa gbaa gburugburu ka ha na-akwàlite omenala na njirimara ha.

Ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka ebuliela ụfọdụ ndị ụkọchukwu na dayọsiisi ahụ n'ọkwa dị iche iche iji wee gaa n'ihu n'ịgbasa oziọma alaeze Chineke.

Aka na-achị Imo State, Rochas Okorocha, agwala onye gọvanọ ahọpụtara ọhụrụ, Emeka Ihedioha, na o nweghị ihe ga-eme ka akwụsị ọnọdụ ịgụ akwụkwọ n'efu nke gọọmenti ya bidoro na steeti ahụ. Ọ mere ka amata nkea ụbọchị Wednezdee oge ya na ndị nta akụkọ na-akparịta ụka na obi gọọmenti dị na Owere, isi obodo Steeti Imo.

Gọvanọ Okorocha kwuru na atụmatu a ga-eri ihe ruru nde dọla 500. Ọ gbakwụnyere na gọọmenti ya ga-etinye otu nde dọla maka ịmalite atụmatụ a.

Sign up via our free email subscription service to receive notifications when new information is available.
Advertisement