A Gbapeela Okporo Ụzọ Ọhụụ Ndị Ojoto Rụrụ, Nye Ya Aha Ọhụụ

Ihe Nkiri
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ndị obodo Ojoto dị n'okpuru ọchịchị 'Idemili South' agbapeela okporo ụzọ ọhụụ ha rụrụ, bụ nke na-azabụ okporo ụzọ St. Barnabas, ma bàgharịzie ya aha ka ọ bụrụzie okporo ụzọ "Eze Oranyelu''.

Ya bụ ọmarịcha okporo ụzọ ndị obodo ahụ jiri aka ha rụrụ onwe ha, bụ nke kilomita ya dị atọ na ụma ise ka e kwuru na o riri ego karịrị nde Naịra iri isii na ise, ma bụrụkwa nke a gbapere site n'aka eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Gerald Mbamalu, onye ọ bụ aha ótútú ya ka a bàgharịzịrị ya bụ ụzọ.

Ọrụ ngo okporo ụzọ ahụ bụ nke a tụpụtara site n'aka òtù "Ojoto South Development Union", bụ òtù jikọtara mpaghara Ojoto Obo-Ọfịa n'okpuru òtù Ojoto Akanasatọ Union (OAU), ma bụrụ nke ogologo ya kwụsịrị n'agbata okè Ojoto na Ọba.

N'okwu ya dịka ọ gbapechara ya bụ ụzọ, Igwe Mbamalụ kọwapụtara mkpa ọ dị obodo na gọọmenti ijikọ aka ọnụ n'ihe gbasaara mmepe òbòdò na mwunye ihe dị iche iche e ji enyere ndụ aka.

Na ntụnye ha n'otu n'otu, onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ maazị Edwin Umeghalụ nakwa onyeisi òtù "Ojoto South Development Union" bụ maazị Chukwudi Maduabum kọwara na ihe kpaliri ha ime nke ahụ bụ mkpa ọ dị iweta mmepe dịkọrọ ọnụ na ya bụ obodo, na itinyekwu aka na mbọ ọchịchị steeti ahụ na-agba n'ihe gbasaara mmepe ime òbòdò.

Ụfọdụ ndị mmadụ selitere isi n'obodo ahụ, nke gụnyere nwaanyị mbụ jiri ọkwa dịka Rektọ nke ụlọ akwụkwọ "Federal Polytechnic Oko" , bụ Injinia Dọkịta Francisca Nwafụlugo tinyere ndị ọzọ, tòrò eze ọdịnala obodo ahụ na ndị ọzọ tinyere aka na ya bụ ọrụ maka ịchọpụta ma tinye uche n'ihe so na ndị kacha bụrụ mkpa dịịrị obodo ahụ.