Top Stories

Mkpu akwa dàrànnọọ n'obodo Ụmụokpu dị n'ikpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra, dịka ọkụ ọgbụgba dabìdòrò ma gbaa otu nnukwu ụlọ pịa-pịa. Ya bụ oke ọkụ bụ nke a na-enyo ènyò na ọ bụ nsogbu sitere n'ọkụ latiriiki kpàtàrà ya, ma bụrụkwa nke gbara ya bụ ụlọ gwòògwòò, tinyere ọtụtụ ngwongwo dị n'me ya, nke gbúru nde kwùru nde Naịra.

Igbo sị na ọnụ anaghị ezu ike ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ata agwụghị, maka na ọ na-abụ a na-etigbu ọ ka na-arịsịta, ị mara na ihe a na-etigbu agwụbèghị n'ebe o si arịpụta.

Onyeisi ndị Uweojii n'ala anyị, Alhaji Mohammed Adamu, ekwuola na mmadụ dị otu puku na iri asaa na otu abụrụla ndị tufuru ndụ ha site na mkpa mkpa ndị omekome kpara n'ọnwa anọ mbụ nke afọ puku abụọ na iri na iteghete.

Igbo sị na otu onye anaghị achụ ngwèrè mgbahige aja, maka na ọ na-abụ e jikọọ aka buo ozu enyi, ọ dị mfe. Ọ bụ nke a mèrè onyeisi ndị uwe ojii ahụ e wètàrà ọhụụ na steeti Anambra, bụ maazị John Abang jìrì wee rịọ njikọ aka nke ndị uwe ojii na ndị nta akụkọ na ya bụ steeti n'ọrụ ịkwàlite ezi ọnọdụ nchekwa.

Igbo sị na ọ na-adị mma a sụgide ụtàrà e hogharịa ọdụ. O wee bụrụ ya, na ka ọ dị taa, onyeisi ndị uwe ojii ọhụụ, bụ Maazị John B. Abang awụchaala na steeti Anambra dịka onyeisi ndị uwe ojii nke iri na asatọ steeti ahụ nwègòrò.

Dịka a sị na onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee ọhụ ahụ, mmadụ dị otu narị, iri ise na ótù abụrụla ndị a nwụchikọrọ site n'aka ndị uwe ojii na steeti Anambra maka ihe gbasaara òtù nzúzo. Ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị òtù nzúzo bụ ndị a nwụchikọrọ n'ime izuụka abụọ site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.

Igbo sị na ọnụ anaghị ezu ike ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ata agwụghị, ma sịkwa na ọ na-abụ a na-egbu ji awaị, ọ na-atọ ụtọ, a na-abachawanye ji. Ka ọ dị taa, ndị uwe ojii steeti Anambra akpụgharịala ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị omekoome, dị iri asaa na otu n'ọnụ ọgụgụ, bụ ndị a nwụchikọrọ site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.

Igbo sị na ọ na-adị mma a gbaa bute, a kwachie, chere ọzọ; ma sịkwa na a naghị aka àkà eje nta agwọ, kama na ọ bụ agwọ pụta, a chụba ya.

N'ịgbaso okwu Igbo ahụ sị na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahige aja, a dụọla ma kpọkuo ndị ntorobịa na steeti Anambra ka ha sonye n'amụma ịkwalite ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ na steeti ahụ.

Sign up via our free email subscription service to receive notifications when new information is available.
Advertisement