Mkpu akwa dàrànnọọ n'obodo Ụmụokpu dị n'ikpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra, dịka ọkụ ọgbụgba dabìdòrò ma gbaa otu nnukwu ụlọ pịa-pịa. Ya bụ oke ọkụ bụ nke a na-enyo ènyò na ọ bụ nsogbu sitere n'ọkụ latiriiki kpàtàrà ya, ma bụrụkwa nke gbara ya bụ ụlọ gwòògwòò, tinyere ọtụtụ ngwongwo dị n'me ya, nke gbúru nde kwùru nde Naịra.

Nwa amadi ahụ na-ewi ewi n'ihe gbasaara ịtọrọ mmadụ, bụ maazị Chukwudumeme Onwuamadike, onye e ji Evans mara, nọrọ n'ụbọchị Wenezdee wee wụchaa n'ụlọ ikpe ukwu dị n'Ikeja Legoosị maka ịzara ọnụ ya n'ihe dị iche iche e kwuru megide ya.

Onyeisi ndị Uweojii n'ala anyị, Alhaji Mohammed Adamu, ekwuola na mmadụ dị otu puku na iri asaa na otu abụrụla ndị tufuru ndụ ha site na mkpa mkpa ndị omekome kpara n'ọnwa anọ mbụ nke afọ puku abụọ na iri na iteghete.

N’ụbọchị sọnde, abalị 4 nke ọnwa ọkụtoba, onye isi ala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari mere njem ilete ndị ahụ merụrụ ahụ mgbe ahụ ndị Boko Haram tụrụ ogbuniigwe na Nyanya yana Kuje. Buhari jere na ngalaba ụlọ ọgwụ ala Naịjirịa ebe a na-agwọ ndị ịhe ike mere, bụ nke a kpọrọ Trauma Centre of the National Hospital na bekee maka ilete ndị ahụ ịhe mberede metụtara na Nyanya yana Kuje.

Dịka e kwuru sị na ihe ọ sọrọ nchì ya zogharịba n'ahịhịa, anya ga-ahụrịrị ya otu ụbọchị; aka ndị uwe ojii na steeti Anambra akpàrálá otu onye n'ime ndị ahụ a na-enyo ènyò na aka ya dị na mgbagbu ahụ a gbàgbùrù onyeisi ọchịchị obodo Nimo dị n'okpuru ọchịchị Njikọka, bụ maazị Frank Anthony Igboka.

Onye minista ala Naịjiria, nke ngalaba na-ahụ maka ịkọpụta nri, bụ Mazị Akinwumi Adesina, so na mmadụ ise ndị a na-atụle maka ọkwa onye isi oche ụlọ ọba ege African Development Bank, nke a na-akpọ AFDB n’aha ịchafụ.

Mmadụ dị puku iri na iteghete, narị atọ na iri abụọ na atọ tinyere akwụkwọ maka ịgụ akwụkwọ n'efu na mba ofesi nke afọ puku abụọ na iri na iteghete na puku abụọ na iri abụọ nke ụlọọrụ PTDF na-achịkọba.