Akinwumi Adesina so azọ ọkwa onye isi oche AFDB

Ndu Mmadu
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Onye minista ala Naịjiria, nke ngalaba na-ahụ maka ịkọpụta nri, bụ Mazị Akinwumi Adesina, so na mmadụ ise ndị a na-atụle maka ọkwa onye isi oche ụlọ ọba ege African Development Bank, nke a na-akpọ AFDB n’aha ịchafụ.

N’okwu AFDB wepụtere tata bụ Fraịdee, onye ọzọ ndị otu bọdụ ụlọ ọba ego ahụ na-atụle, bụ Mazị Sufian Ahmed, minista ngalaba ọnọdụ akụ n’ụba nke mba Etiopịa. Ha kwukwere si na a họpụtara mmadụ ise ndị ahụ a na-atụle mgbe otu kọmitii ụlọ ọba ego ahụ nwere nzukọ n’Abijan, na mba Kotovua, n’abalị iri n’otu nke ọnwa febụwarị afọ a.

Ndị ọzọ a na-atụle maka iwere oche, mgbe oge ochịchị Donald Kaberuka ga-abịa n’isi njedebe, bụ Cristina Kamara, minista ọnọdụ akụ n’ụba na Kep Vede, Kordjé Bedoumra, minista ọnọdụ akụ n’ụba na Chad. A ga-eme ntụli aka maka ihọpụta onye isi oche AFDB n’ọnwa Mee afọ 2015.

www.igboschool.org