Igbo sị na otu onye anaghị achụ ngwèrè mgbahige aja, maka na ọ na-abụ e jikọọ aka buo ozu enyi, ọ dị mfe. Ọ bụ nke a mèrè onyeisi ndị uwe ojii ahụ e wètàrà ọhụụ na steeti Anambra, bụ maazị John Abang jìrì wee rịọ njikọ aka nke ndị uwe ojii na ndị nta akụkọ na ya bụ steeti n'ọrụ ịkwàlite ezi ọnọdụ nchekwa.

Igbo sị na ọ na-adị mma a sụgide ụtàrà e hogharịa ọdụ. O wee bụrụ ya, na ka ọ dị taa, onyeisi ndị uwe ojii ọhụụ, bụ Maazị John B. Abang awụchaala na steeti Anambra dịka onyeisi ndị uwe ojii nke iri na asatọ steeti ahụ nwègòrò.

Ndị uwe ojii na steeti Anambra anwụchikọọla ma kpụgharịa ụfọdụ ndị a na-enyo ènyò na ha na-etinye aka n'arụrụ ala, nke otu onye n'ime ha bụ maazị Ikechukwu Udensi, onye a maara dịka Ikanda, bụ onye a na-enyò na ọ bụ ogbu mmadụ.

Dịka a sị na onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee ọhụ ahụ, mmadụ dị otu narị, iri ise na ótù abụrụla ndị a nwụchikọrọ site n'aka ndị uwe ojii na steeti Anambra maka ihe gbasaara òtù nzúzo. Ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị òtù nzúzo bụ ndị a nwụchikọrọ n'ime izuụka abụọ site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.

Gọọmeenti steeti Anambra etòóla ndị ọrụ uwe ojii steeti ahụ maka ezi ọrụ ha n'ịnwụchikọ na ịkpụpụ ụlọ ikpe, maazị Ikechukwu Udensi, onye a maara dịka Ịkanda, ma bụrụkwa onye a na-enyo ènyò na ọ bụ ogbu mmadụ na onye gburu maazị Ndubuisi Nwokolo na mkpewara ụzọ Otumoye dị n'Ọdọakpụ Ọnịtsha, na steeti ahụ n'abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Juunu ahọ 2018.

Ndi otu na-eme ngagharị iwe ma na-akpọkwa oku ka onye isi ala bụ Muhammad Buharị chighata malite ọrụ ma ọ bụ gbaa alụkwaghị m, ekwuputana na ya bụ onye isi ala ji ala Naịjiria n'ọrụ nke ukwu. Ndi otu ahụ kwuru na Buharị, bụ onye hapụrụ ala Naịjiria gaba ịnara ọgwụgwọ na mba Lọndọn kemgbe ihe karịrịṅ ụbọchị iri itoolu gara aga akpụọla ọnọdụ akụ na ụba nke ala anyị afọ n'ala ma meekwa ka ihe niile kwụrụ agaghị aga.

Ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra ewepùtela ma kwàdo atụmatụ iwu ọhụụ megidere oke mmefù oke ego a na-emefùkarị na mmemme akwamozu na steeti ahụ. Atụmatụ iwu a bụ nke e nyèrè kwàdo n'ọgbakọ ndị ụlọ omebe iwu ahụ nwere ụbọchị tuuzdee n'ogige ha dị n'Awka, ma bụrụkwa nke a tụpụtara site n'aka onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anaọcha nke abụọ na ya bụ ụlọ.

Gọọmenti ala Naịjirịa ekwuola na Ọ na–agba mbọ niile O nwere ike maka ịdọta ndị oji ego achụ ego n’ala Naịjirịa.

Onye minisita ala Naịjirịa na–ahụ maka Naịjirịa ọrụ ugbo na mmepe ime ime obodo bụ Maazị Audu Ogbeh kwuputara nke a mgbe Ọ gwara ndị nta akụkọ okwu gbasara ọgbakọ ya na ndị oji ego achụ ego si mba Jamini nwere.

Ndị Ọlụ Uweojii, ngalaba Steeti Enugwu, nọrọ ụbọchị Wednezdee, nwụchịkọọ mmadụ abụọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị isi otu ahụ tọrọ ma gbuo onye ụkọchukwu Katọlik na Enugwu, Ụkọchukwu Clement Ugwu, n'okpuru ọchịchị ime obodo Ezeagu na Steeti ahụ.

Gọọmenti Steeti Bornu na-adọ ndị niile ahụ gbara ọsọ ọgụ Boko Haram na steeti ahụ aka na ntị ka ha wetuo obi ha ala maka ịlọghachi be ha. Mgbe ahụ ndị Boko Haram wakporo obodo dị iche iche na Bornu, ọtụtụ ndị mmadụ gbara ọsọ ọgụ. Ugbu a, ndị agha nke Naịjiria na-enwete mmeri, na-achụpụzị ndị Boko Haram n’obodo ndị ahụ. Ọtụtụ ndị ahụ gbara ọsọ ọgụ amalitego laghachiwe be ha.

More Articles ...

Page 1 of 2