Aka na-achi Steeti Edo akpoola ndi uwe ojii oku gbanu gbanu

Nchekwa Obodo
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ndị Channels Television na-ekwu n'aka na-achị Steeti Edo, bụ Adams Oshiomole, enyela ndị uwe ojii nanị mkpụrụ ụbọchị 14 ka ha were chọpụta ndị gburu Oyerinde Olaitan, onye ndụmọdụ pụrụ iche Oshiomole, yana akawe ukwu ya.

Gọvanọ Oshiomole nyere ndị uwe ojii iwu ka ya na ndị isi otu ndọrọndọrọ ochịchị Steeti ahụ mechara ngaghari iwe na Benin.

Oshiomole gwara ndị isi otu ndọrọndọrọ ndị n’agba ya ụkwụ ka ha wepu aka n’ihe ọjọọ.

Ndị abalị dị egwu anọ a na-eche na ha riri ngo jere be Oyerinde gbuo ya, n’ihe dịka elekere abụọ nke isi ụtụtụ Fraịdee. Ha gbara ya ọnụ mgbọ atọ.

Otu jikọtara ndị ọrụ, bụ Nigeria Labour Congress akọtọgo ụdị akparamagwa a. Ndị NLC kpọrọ gọọmenti etiti ka o tinye aka mee nnyocha were chọpụta ebe mmiri siri ba n’opu ụgbọgụrụ.