Ndị Uwe Ojii Anwụchikọọla Ịkanda, A Na-Enyo Enyo Na Ọ Bụ Ogbu Mmadụ

Nchekwa Obodo
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ndị uwe ojii na steeti Anambra anwụchikọọla ma kpụgharịa ụfọdụ ndị a na-enyo ènyò na ha na-etinye aka n'arụrụ ala, nke otu onye n'ime ha bụ maazị Ikechukwu Udensi, onye a maara dịka Ikanda, bụ onye a na-enyò na ọ bụ ogbu mmadụ.

Ikanda gbárá ahọ iri abụọ na asaa sitere Azịa n'okpuru ọchịchị Ihiala bụ onye a na-enyo enyo na ọ bụ ya na ndị òtù ya gbùrù otu nwoke a maara dịka Ndubuisi Nwokolo na mkpewara ụzọ Otumoye dị n'Ọdọakpụ Ọnịtsha, na steeti Anambra n'abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Juunu ahọ 2018.

N'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ dịka ọ na-akpụgharị ndị ahụ n'isi ụlọ ọrụ ndị uwe oji dị n'Amawbịa, onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Mustapha Dandaura mere ka a mara na e jidere ya bụ nwoke n'Ọnịtsha site n'ọrụ nke alaka ndị uwe ojii na-ahụ maka iji ọgụgụ isi achọpụta ihe, ma kwenwèé nkwà na ha agaghị ada mbà n'ọrụ ya na n'agha ọ na-ebu megide ohi, mpụ na arụrụ ala na steeti ahụ.

O kwupùtakwara ezi njìkere ha dị ịkwàlite ezi nchekwa ndụ na akụnụba na steeti ahụ, ma kpọkùkwazie ndị ụmụafọ Anambra ka ha na-ewèta mkpesa n'aka ndị ọrụ nchekwa oge niile ma na-emekwa ka ha mara banyere ebe na mgbe ọbụla ndị omekome na-akụ akụmakụ site n'ịkpọtụrụ ha ozigbo, ma sikwazie n'ụzọ dị otu ahụ kwàlite ma nyere ha aka n'ọrụ nchekwa ha.

Ndị uwe ojii ahụ kpụgharịkwara ndị ọzọ a na-enyo ènyò na ọ bụ ha wakpòró ògigè ndị uwe ojii dị n'Ajalị, suo ya ọkụ ma bukọrọ egbe dị ebe ahụ gbafuo. Mana mmadụ ndị ahụ gọrọ aka na ọkpà ha, sị na o nweghị ihe ha mà bànyere ebubo ahụ a na-ebo ha; ọbụnadị dịka Ikanda n'onwe ya gọrọkwara agụgọ, kwuo na ya bụ onye na-arụrụ gọọmenti ọrụ, ma sịkwa na ọ bụ naanị mgbe a gwara ya na ndị òtù ya gbùrù mmadụ n'ime ahịa ka ya pụtara.

Maazị Dandaura gàzịrị n'ihu mee ka a mara na a kà na-eme nnyòcha miri èmì bànyere nkè ahụ, nke mgbe e mechara ya, a kpụpụ ndị ahụ ụlọ ikpe ma were usoro iwu nyụchaa ha anya.