Mmadụ Iteghete, tinyere Ụmụ Aka, Anwụọla na Ọgbaghara Dị na Kaduna

Nchekwa Obodo
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ozu mmadụ iteghete, tinyere ụmụ aka, bụ nke ndị ọlụ nchekwa butegoro n'ọgba aghara ahụ ebe agbara ọtụtụ ụlọ ọkụ n'otu obodo.

Gọọmenti Steeti Kaduna ekwuola na ụmụ afọ mmadụ iteghete atụfuela ndụ ha n'ọgba aghara ahụ dị n'ime obodo Nandu, nke dị na okpuru ọchịchị ime obodo Sanga n'ọnụ ụtụtụ ụbọchị Satọdee, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa March.

N'edemede nke Samuel Aruwan, bụ nnukwu onye na-enyere gọvanọ steeti ahụ ahụ n'ihe gbasara mgbasa ozi, wepụtara na Satọdee, katọrọ ogbugbu ahụ e gburu ndị mmadụ.

Nasir El-Rufai, bụ gọvanọ Kaduna Steeti, kasiri ndị niile nke a metụrụ n'otu ụzọ ma ọ bụ ụzọ nke ọzọ obi ngwangwa ya na ndị ọlụ nchekwa kpasịrị ụbụbọ.

Edemede bụzi nke kwuru na: "Gọọmenti Steeti Kaduna enwetala ozi site n'aka ndị ọlụ nchekwa gbasara ọnwụ nke mmadụ iteghete n'aka ndị omekome, bụ ndị wakporo obodo Nandu n'okpuru ọchịchị ime obodo Sanga n'ọnụ ụtụtụ taa."

"Site na ịgba mbọ na njikọ aka ọnụ ha, ndị ọlụ nchekwa ebutela ozu mmadụ iteghete, nke gụnyere ụmụ aka. Ndị omekome a gbara ọtụtụ ụlọ ọkụ n'obodo ahụ. Gọọmenti Kaduna nọrọziri wee kagbuo kpamkpam ya bu àgwà nke lara ndụ ụmụ afọ steeti ahụ n'iyi ma rịọkwaa obodo dị iche iche ka ha mụrụ anya ka azụ ịhụ na ha nọchibidoro ndị na-achọghị udo.

"Aka na-achị steeti ahụ, nọrọziri n'aha steeti ahụ na ụmụ afọ Kaduna, tie ezinaụlọ niile nke a metụtara aka n'obi ma rịọkwaa ka mkpụrụ obi ndị niile nwụrụ anwụ zuo ike n'udo.

"Gọọmenti, ndị ọlụ nchekwa, ndị isi obodo na ụlọ okpukpere dị iche iche ga na-agba mbọ ịlụsi ọlụ ike iji were hụ na udo were ọnọdụ na Steeti ahụ. N'oge iri ụjụ a, k'anyi bịakọta ọnụ were buo agha megide atụmatụ niile nke ndị achọghị ọdịmma na ọganihu nke mmadụ na ibe ya."

"Ọgbaaghara alaana ndụ ọtụtụ n'iyi ma merụọ ndị ọzọ ahụ, mebie ụzọ obibi ọtụtụ ndị, tinye égwù na ihe iri ụjụ n'obi ndị mmadụ. Anyị ga-emeri nke a site na ịsọpụrụ ibe anyị, idozi esemokwu dị n'etiti anyị na ị kọrọ ndị ọ dị n'aka gbasara ọnọdụ anyị na-enyo enyo ma ọ bụ nke na-adịchaghị mma. Ajọ ihe agaghị enwelata mmeri n'ebe ọdịmma mmadụ na ibe ya dị.

Ndị ọlụ nchekwa bụzi ndị ahụrụ ka ha na-akparaghị na mpaghara ahụ iji hụ na udo chighatara azụ n'obodo ahụ.