Ozi anyị nwetere site n’aka ndị Guardian nke ala Nigeria na-ekwu na tigbuo zọgbuo na-ada n’etiti ndị obodo Eggon na ndị Gwandere na Steeti Nasarawa. Anyị nụrụ na e gbuola mmadụ iri ano n’ise n’agha ahụ agbụrụ abụọ ndị a na-ebuso onwe ha. Anyị nụrụ n’agbụrụ abụọ ndị a na-azọ ala.

Ndị EFCC, ngalaba na-ahụ maka ịchụ nrụrụ-aka na iri-ngo ọsọ na Nigeria, jidere onye bụbu onye isi oche ụlọ ọba ego etiti, Charles Soludo, ụnyahụ bụ Tọzdee.

Ndị Channels Television na-ekwu na ndị otu Boko Haram ekwuona na ọ bụ hanwa tụrụ ogbunigwe ahụ gburu mmadụ 22 na Steeti Plateau n’ụbọchị Sọndee. N’ime ndị nwụrụ anwụ gụnyere otu onye Sinetọ, nakwa otu onye omebe iwu ụlọ ọgbakọ etiti nke Steeti Plateau. Mana ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na mkpamkpa ahụ si n’aka ndị na-alụ ọgụ agbụrụ.

Ndị Channels Television na-akọwa na mmadụ abụọ ndị otu Boko Haram anwụọla na Steeti Kanọ. Nke a mere ka ndị uwe ojii na ndị soja bagidere otu ebe mgbaba ndị otu ahụ n’ụbọchị Satọdee. Ụgbọala ndị Boko Haram ahụ kwara ogbunigwe nay a gbawara were gbuo mmadụ abụọ ndị ahụ. Ogbunigwe ahụ merụrụ mmadụ abụọ ndị soja ahụ.

Page 2 of 2