Igbo sị na ọnụ anaghị ezu ike ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ata agwụghị, ma sịkwa na ọ na-abụ a na-egbu ji awaị, ọ na-atọ ụtọ, a na-abachawanye ji. Ka ọ dị taa, ndị uwe ojii steeti Anambra akpụgharịala ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị omekoome, dị iri asaa na otu n'ọnụ ọgụgụ, bụ ndị a nwụchikọrọ site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.

Igbo sị na nwata a na-agwọ ibì ọ na-eto afọ, ị mara na o nwèrè ihe ọ tọbàrà n'ajọ ọfịa. O wee bụrụ ya, na ka ọ dị taa, na ndị uwe ojii na steeti Anambra anwụchikọla ndị òtù ohi ọzọ n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, na-agbanyeghị mbọ dị iche-iche ọchịchị steeti ahụ gbàgòrò imemìla ohi na arụrụ ala na steeti.

E meela ka a mara na gọọmenti steeti Anambra ga-amalitekwa ịkụtùsi ụlọ ọbụla e ji were eme mpụ ma na-arụkwa arụrụala dị iche iche dịka izo ohi, idebe ndị a tọọrọ atọrọ na omekoome ndị ọzọ na-eweta ala adịghị mma na steeti ahụ.

Òtu ahụ jikọtara ndị ọrụ nchekwa dị iche-iche na steeti Anambra, bụ nke a maara dịka 'Anambra State Security Council' adụọla ụmụafọ steeti ahụ ka ha ghara ịtụ egwù n'ịbata ụlọ maka nzukọ ọnwa Ọgọstụ ahọ a, n'ihi na egwu ọbụla adịghị.

Igbo sị na ọ na-abụ onye e nyèrè mara chịkwaa, e nyekwuo ya nke ka nkè. Ka ọ dị taa, aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ eduola oriakụ Ijem Ọnwụamaegbu n'ọrụ dịka ọkaikpe mkwụmọtọ steeti ahụ, na dịka nwaanyị mbụ na-eji ya bụ ọkwa. Oke mmemme idu n'iyi ọrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka, bụ isi obodo steeti ahụ, oge ndị isi ọchịchị steeti ahụ nwere nzukọ.

Ndị uwe ojii na steeti Anambra ejidela mmadụ ruru ótù nàrị na iri na atọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị òtù nzuzo na ndị na-apụnara mmadụ ụgbọala ha n'ike. Onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Rabiu Ladodo mere ka a mara nke a n'okwu ọ gwàrà ndị nta akụkọ oge a na-akpụgharị ndị ahụ, bụ ndị o kwùrù na e jidèrè n'ọtụtụ ebe dị iche iche na steeti ahụ.

More Articles ...

Page 1 of 2