Kọmishọna ọhụụ e wètara maka ndị uwe ojii na steeti Anambra, bụ maazị Danduara Mustapha ekwuola na ya ga-agbasi mbọ n'ịhụ na e nwere ezi nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ, dụọ ndị otu nzuzo na ndị na-ebute ala adịghị mma ka ha rie adụ dụọ onwe ha, ma rịọkwa ka e nwee ezi mmekọrịta n'etiti ọhznaeze na ndị uwe ojii, iji rụọ ọrụ ha nke ọma na n'ụzọ pụrụ kwesiri ekwesi.

Ndị uwe ojii na steeti Anambra ejidela mmadụ ruru ótù nàrị na iri na atọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị òtù nzuzo na ndị na-apụnara mmadụ ụgbọala ha n'ike. Onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Rabiu Ladodo mere ka a mara nke a n'okwu ọ gwàrà ndị nta akụkọ oge a na-akpụgharị ndị ahụ, bụ ndị o kwùrù na e jidèrè n'ọtụtụ ebe dị iche iche na steeti ahụ.

Onye nnọchite anya ala anyị na mba ofesi n‘oge gara aga ma bụrụkwa nwunye Dim Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu lagoro mmụọ, bụ oriakụ Bianca Ojukwu adọọna onye ndu ndi IPOB bụ maazị Nnamdị Kanụ na ndi otu ahụ aka na ntị banyere nhọpụta ọkwa ọchịchị a ga-eme na steeti Anambra.

Dịka a sị na ọ na-abụ e kwòghị ìrùrò na gboo, ọ ghọọ ajọ ọhịa, a nwụchikọọla otu nwata nwoke gbara ahọ iri na atọ na-ezu ohi n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra. Nwata nwoke ahụ, onye aha ya bụ Ekene Chukwuchebe bụ onye e jidere na ncherịta iru ụlọ ụka Winners Chapel dị na mpaghara okporo ụzọ Ọby Okoli n'Ọkpụnọ.

Ndị uwe ojii na steeti Anambra anwụchikọọla mmadụ iri na anọ, maka itinye aka n'arụrụ ala na ihe ndị ọzọ megidere iwu dịịrị nhọpụta ọchịchị, na ntụli aka izugbe ahụ e mere n'ala anyị n'izu ụka gara aga.

Onye ndu nke ndi otu Indigenous People Of Biafra(IPOB) bụ maazị Nnamdị Kanụ ekwuona hoohaa n'ebe o doro anya, na igbu mmadụ esoghị na omenala e jiri mara ndi Igbo.

Ya bụ onye ndu ndi otu ahụ kwuputara nke a ka ọ na-akatọ kpamkpam mgbusi ahụ e gbusiri ndi na-akara onwe ha ụka n'ọzụbụlụ ụbọchị ụka gara aga site na aka ndi amaghị ndi ha bụ.

Dịka a sị na a gbaghị Ụzọ oweri mgba ọ naghị echi, ụlọ ọrụ ahụ na-ebu agha megide ịkpọ, ma ọ bụ ịtụ mgbere ọgwụ ike, ngalaba ya nke steeti Anambra anwụchikọọla ma kpụgharịa mmadụ iri na asatọ, bụ ndị a na-enyo ènyò na ha na-etinye aka n'ọgwụ ike Cannabis Sativa.

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ akatọọna kpamkpam, mkpamkpa ahụ dị oke egwu nke kpara n'Ọzụbụlụ n'ubọchị ụka gara aga ma foro ntutu ya taa ime oke nnyocha miri emi banyere ya bụ ajọ ọnọdụ iji nwụchikọọ ndi obi kpọnkụ ahụ kpara ya bụ arụ. Gọvanọ Obianọ kwuputara nke a ma mee mkpebi ahụ oge ọ gbaruru n'ebe ahụ ya bụ njiịji nọrọ wee jie, bụ ụlọ ụka (Katọlik) St. Philips nke dị n'Ọzụbụlụ dị n'okpuru ọchịchị Ekwusigo na steeti ahụ. Ya bụ Gọvanọ gosiputakwara obi mwute ya banyere ya bụ mwakpo ọnụ ụtụtụ nke were ihe karịrị ndụ mmadụ iri, ebe ọtụtụ bụkwa ndi natara mmerụ ahụ dị iche iche.

More Articles ...

Page 2 of 3