Top Stories

Gọọmenti steeti Anambra, site n'aka isi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe metụtara ndị nne na ụmụaka na steeti ahụ, bụ 'Ministry of Women and Children Affairs' ebidorola ụmụaka ruru iri na isii n'ọnụ ọgụgụ akwụkwọ. Ụmụaka ahụ bụ ndị e tinyèrè n'ụlọ akwụkwọ n'isimbido izuụka a, ma bụrụkwa ndị a kpọtàrà site n'ogige ebe ụmụaka enweghị nne na nnà dị n'ebe dị iche iche.

Igbo sị na-abụ e too onye gburu ewu, ọ hụ ehi, o gbuo. N'ịgbaso nke a, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ na nso-nso a wee nabata ndị nkuzi ahụ sitere steeti Anambra, bụ ndị nwetara nturu ugo dị iche iche n'asọmpi a chịkọbara na mmemme ncheta ụbọchị ndị nkuzi na mba ụwa, nke ahọ 2019, bụ nke a chịkọbara n'Abụja.

Igbo sị na ọ na-abụ dike leghachi anya azụ ebe ọ malitere kpaba ike, ọ jaa onwe ya ike; maka na ihe e mèrè mete ya mma na-adị mma ítò, tòté ya mma.

Asọmpi Nkwàlite Mmụta

Agum Akwụkwọ

Oke ọñụ dara n'okpuru ọchịchị Ayamelụm dị na steeti Anambra nso-nso a dịka otu nwa amadi ọrụ obi ebere na-echu ụra, bụ Maazị Alphonsus Ofumelụ nyèrè onyinye ego wee nyegara ụmụakwụkwọ dị iche iche nwetara nturu ùgò n'asọmpị ọ chịkọbààrà ụmụakwụkwọ nọ n'ogo sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ dị iche iche dị n'okpuru ọchịchị ahụ.

A kpọkuola ndị nkuzi na steeti Anambra ka ha bàgide n'iji usoro ọgbara ọhụụ ICT were enye nkuzi ma na-akwàlitekwa ọnọdụ mmụta.

Aka na-achị Ondo Steeti, Rotimi Akeredolu, agọpụla aka ya na ọkpa ya ụbọchị Tọzdee banyere kepu kepu nke na-aga n'ihu na steeti ahụ na ọ nyere iwu ka e bulie ụgwọ akwụkwọ mahadum abụọ ahụ steeti nwere.

Nwa-afọ ala Igbo a ma ama maka ide akwụkwọ eturula ugo National Critics Book na mba Amerịka. Adiche nwetere nturu-ugo a maka akwụkwọ ahụ o dere nke a kpọrọ Americanah. Adiche kọrọ akụkọ nwata nwanyị onye Nigeria, hapụrụ ala nna ya gawa mba Amerịka maka ịgụ akwụkwọ.

Ụmụnna m ndị Igbo, ndị CISA na ndị Wachet, gịnị ka anyị na-anụ? Onye nwụrụ? Ihe ukwu emeela n’ụbọchị ahịa ukwu! Oke osisi ndị Igbo ji eme ọnụ a daala! Mbazụ igwe ndị Igbo ji akpaa nganga agbajiela! Ọnwụ egburule Akanaede akwụkwọ, Professor Albert Chinụalamọgụ Achebe, Dimkpa Agụ ndị Igbo, Nwa diala ndị Ogidi, Anambra State! Onye Oji deekara onye Bekee n'oyibo! Onye Oji kuziri onye Ọcha otu eji asụ ma na-ede okwu Bekee! Oke Agụ ụmụ Igbo ji eme ọnụ! Chai, ike agwụla!

Ndị ụlọ ọrụ 'Operation Clean and Healthy Anambra' bụ ndị a mààrà dịka ỌCHA Brigade eburula ozi nkuzi bànyere adịmọcha gburugburu wee bàá n'ime ahịa dị iche iche dị n'Ọnịtsha, iji wee kwàlite ezi ọnọdụ gburugburu bụ ịgbà ma bèlatakwa nsogbu a gbakata a kwụrụ a na-enwegasị n'okporo ụzọ dị iche iche na mpaghara ebe ahụ.

Ọ bụ nnọọ ụbọchị akwa na àrịrị n'Ọnịtsha na steeti Anambra dịka ọkụ dị egwu gbagwòrò ma gbapịa ụlọ na ngwongwo gburu nde kwùrú nde Naịra.

Gọọmenti steeti Anambra amachiela kpam kpam ihe ọ bụla bụ ibugharị ahịa mbugharị na ịzụ ahịa n'okporo ụzọ ọbụla na steeti ahụ.

Dịka a sị na chi na-abọ, ihe ọjọọ ana-abọta, ọkụ ọgbụgba agbagbuola ụmụaka atọ n'Obosi dị n'okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra. Ya bụ ajọ ọdachi bụ nke dapụtara dịka ọkụ binwùùrù n'ebe a na-ere ahịa dị na mpaghara okporo ụzọ 'High Tension School'.

Dịka a sị na ihe ọma na-aka mma na ọhà mara, a gbapeela ọmarịcha ahịa Nkwọ ọhụụ ahụ a rụụrụ ndị Nando site n'aka otu nwaafọ obodo ahụ, bụ Chiifu John Iwunọ.

Aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụbọchị Wenezdee wee guzobe Ọkaikpe Manasseh Anyachebelu dịka onye ga-ejidegodi ọkwa Ọkaikpe Nkwụmọtọ steeti ahụ ugbua. Mmemme nguzobe ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ndị isi ọchịchị steeti ahụ na ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche.

Ụmụafọ obodo Ndịowu dị n'okpuru ọchịchị Orumba North na steeti Anambra enwetala akwụkwọ ndọrọ ego ruru otu nde Naịra na ụma ise iji wee malite ọrụ ebe obibi maka ndị ji otu ahọ efe ala nna anyị n'ụlọ akwụkwọ 'Community Secondary School, Ndiowu' n'okpuru amụma ọrụ mmepe ime-ime obodo a kpọrọ 'Anambra State Community and Social Development Agency (ASCSDA)' bụ atụmatụ ọrụ ụlọ ọba ego mba ụwa na-akwàdo.

Dịka a sị na omepùrú onye ogbenye bụ chi ya ka ọ na-emere, a kpọkuola ma dụọ ndị aka ji akụ ka ha na-echeta ma na-enyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ na gburugburu ha aka, iji kwàlite ezi ọnọdụ obibi ndụ ha.

Ụlọ ọrụ 'Anambra State Community and Social Development Agency', (ASCSDA) bụ ụlọ ọrụ mmepe ụlọ ọba ego mba ụwa na-enye nkwàdo na steeti Anambra ekwuola na ọ ga-amalitekwa ikesàkwùrù ụfọdụ ime obodo dị iche-iche na steeti ahụ ego iji kwàlite atụmatụ ọrụ mmepe malite n'ụbọchị Mọnde izuụka na-abịa abịa.

Ụlọ ọrụ National Orientation Agency na Qatar Charity enyela ndị ekpenta ihe oriri dị iche iche ruru nde naira iri n'ime obodo Alheri, n'ogige Kwali na Abuja nakwa ndị Dakwa dịka ndị ritere uru n'ihe onyinye iji nyere ndị o nweghị ka ọha ha n'ọnwa Ramadan. 

Afọ ọ bụla, ụbọchị mbụ nke ọnwa Me bụ ụbọchị amara nke ọma dịka ụbọchị ndị ọlụ. Ọ bụkwa ụbọchị ndị ọrụ na mba ụwa niile. Ọ bụ ụbọchị eji echeta ezi ọlụ niile ndị ọlụ na-arụ n'obodo ma bụrụkwa oge eji agba ha ume ma jaa ha ike n'ihi ọlụ ha pụtara ìhè na ngalaba ọchịchị.

N'iji bèlata oke ihe mberede okporo ụzọ, gọọmenti okpuru ọchịchị Nnewi South, nke steeti Anambra azọpụla ụkwụ dike ijikọ aka ọnụ, ya na ndị òtù ọrụ ala anyị na-ahụ maka ije awele na nchekwa okporo ụzọ, bụ ụlọ ọrụ 'Federal Road Safety Corps'.

Akpọkuela Gọọmenti Etiti ka ha wepụ ego mgbakwụnye na mmanụ ụgbọala. Nke a ka onyeisioche International Monetary Fund, Christine Lagarde, kwuru na ọ bụ ihe ziri ezi ma kwesikwa ekwesị ime.

Chi ewerela ehihie jie na Mọndee n'ọdụ ụgbọelu Sam Mbakwe dị na Owerri, isi obodo Imo Steeti. Ọkụ ahụ bụ nke gbara na ebe ahụ ndị njem si abata n'ọdụ ụgbọelu ahụ.

Gọọmenti ala Naịjiriịa ekwuona na ya na-agba mbọ ịrụtọpụ ọrụ niile ya ji n’aka ugbu a maka ịhazigharị ngalaba njem ụgbọelu. Onye minista na-ahụ maka njem ụgbọelu, Osita Chidoka, gwara ndị nta akụkọ na ngalaba njem ụgbọelu na-ahọrọzi ọlụ ndị kachasị mkpa n’ime ọlụ niile dịịrị ya.

Ka o mechara ọnwa asatọ otu ụgbọ-elu ha kpọkasịrị na Iju-Ishaga, were gbuo mmadụ 160 na Lagos, ndị Dana Air amalitekwana ime njem ọzọ n’ala Nigeria.

Ka ihe mberede ụgbọ-elu ahụ mechara n'abalị atọ nke ọnwa juunu afọ 2012, gọọmenti ala Nigeria na ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọ-elu napụrụ ndị Dana Air akwụkwọ ikike ife ụgbọ-elu.

Sign up via our free email subscription service to receive notifications when new information is available.
Advertisement