Anambra Abụrụna Ndị Kacha Me Nke Ọma n'Ule WAEC Ahọ 2017

Agum Akwụkwọ
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

E kwuputana na steeti Anambra abụrụna ndị kachara wee mee nke ọma n'ule WAEC nke ahọ 2017. Onye Kọmishiọna na-ahụ maka agụm akwụkwọ na steeti ahụ bụ ọkammụta Kate Azụka Omenụgha kwupụtara nke a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

E kwuputana na steeti Anambra abụrụna ndị kachara wee mee nke ọma n'ule WAEC nke ahọ 2017.

Onye Kọmishiọna na-ahụ maka agụm akwụkwọ na steeti ahụ bụ ọkammụta Kate Azụka Omenụgha kwupụtara nke a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Ọ sị na Ndị steeti ahụ nwetere akara krediti dị pacentị iri asaa na ise na ụma atọ, ma n'ihe ọmụmụ asụsụ bekee na gbakọ na mwepu.

Ọkammụta Omenụgha kwukwara na ha na-agbasi ezi mbọ ike iji hụ na ha mechisịrị ebe dị iche iche a na-egwu ojoro n'ule na steeti ahụ maka na agụm akwụkwọ na nkuzi a na-enye ụmụakwụkọ na steeti ahụ bụ nnọọ nịe na-ada ụda na nke zuru okè.