Gọọmenti Anambra Ebidorola Ụmụaka Iri Na Isii Akwụkwọ

Agum Akwụkwọ
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Gọọmenti steeti Anambra, site n'aka isi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe metụtara ndị nne na ụmụaka na steeti ahụ, bụ 'Ministry of Women and Children Affairs' ebidorola ụmụaka ruru iri na isii n'ọnụ ọgụgụ akwụkwọ. Ụmụaka ahụ bụ ndị e tinyèrè n'ụlọ akwụkwọ n'isimbido izuụka a, ma bụrụkwa ndị a kpọtàrà site n'ogige ebe ụmụaka enweghị nne na nnà dị n'ebe dị iche iche.

Ha bụ ụmụaka, nke gụnyere ụmụnwoke iteghete na ụmụnwaanyị asaa bụ ndị e tinyere n'otu ụlọakwụkwọ dị n'Awka, ebe ha màlitegoro isonye na mmụta na ihe dị iche iche a na-eme ebe ahụ.

N'okwu ya bànyere nke ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ndị nne na ụmụaka, bụ Nwaada Ndịdị Mezue kwùrù na nke ahụ dabàrà adabà n'ezi ebumnobi na mmasị ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ inye ụmụafọ steeti ahụ agụmakwụkwọ, na ịkwàlìtè ọnọdụ mmụta bụ ịgbà na ya bụ steeti.

O mere ka a mara na otu ahụ e siri bidoro ụmụakwụkwọ ahụ agụmakwụkwọ ga-enye aka mee ka ha na ụmụaka ndị ọzọ nà gburugburu ha na-enwe mmekọrịta, mee ka ha mesàpụ ahụ, ma kwàlitezie ọnọdụ mmụta na ọgụgụ isi ha.

Ka ọ na-akọwa na ụmụaka ahụ na agụmakwụkwọ ha ga-anọ n'okpurù nlekọta gọọmenti steeti ahụ, Nwaada Mezue gakwara n'ihu kwunwèé ezi njikere ọchịchị nọ ugbu a na ya bụ steeti dị ịkwàlìté ngalaba mmụta, ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ steeti ahụ, nakwa ngalaba niile nke ya bụ steeti, ọbụnadị dịka ọ dụrụ ụmụakwụkwọ ahụ ka ha tinyesie uchu ike n'agụmakwụkwọ ha.