Narị Abụọ na Iri Anọ na Otu (241) Ụmụ Akwụkwọ UI Nwere Kụlasị Mbụ

Agum Akwụkwọ
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Mahadum Ibadan, Ibadan nọ ụbọchị Tuzdee were kwuo na ụmụ akwụkwọ puku asaa, narị anọ na iri atọ (7,430) agụchaala akwụkwọ ebe mmadụ narị abụọ na iri anọ na otu n'ime ha bụ ndị jiri kụlasị mbụ were pụta na ya bụ mahadum na mpaghara dị iche iche ha gụrụ n'afọ akwụkwọ nke 2017/2018.

Nwaada Ebhomielen Ofure Mary sitere na ngalaba sayensị ìgwè computa mere ihe ịtụnanaya site n'iji akara 7.0 CPGA pụta na mahadum ahụ. N'okwu ya, ọ rịọrọ ndị otu ya ka ha gosi ume ha ebe ọ bụla ha hụrụ onwe ya, sị n'ụwa ejighị onye ọ bụla ụgwọ.

Onyeisi mahadum ahụ, Ọkammụta Idowu Olayinka, nọrọ ogige ezumezu International Conference Center nke ya bụ ụlọ akwụkwọ, were kwuo n'ụlọ akwụkwọ ahụ na-eme mmemme ahụ na ezi mmepe o wetara.

N'okwu ya, "Ụmụ akwụkwọ dị narị abụọ na iri anọ na otu (241) n'ọgụgụ jiri kụlasị mbụ were pụta. Ngalaba sayensị nwere ụmụ akwụkwọ kacha dị iri anọ na isii (46), ebe ngalaba ọrụ ugbo na ọhịa na ngalaba nkà na ụzụ nwere mmadụ iri atọ na asatọ (38) na iri abụọ na asaa (27).
"Ị kọwa ka ụmụ akwụkwọ siri mee gosiri na pacenti 3.38 na pacenti 27.61 nke ụmụ akwụkwọ ndị gụchara jiri kụlasị mbụ na kụlasị abụọ (ogogo nke mbụ) were pụta."