Mba China enyela ụmụ akwụkwọ iri anọ na asatọ na Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka, Anambra Steeti, ọnọdụ agụm akwụkwọ n'efu. Ọnọdụ agụm akwụkwọ ahụ bụ nke enyere ụmụ akwụkwọ ahụ ụbọchị Wednezdee site n'aka onye nnọchiteanya mba China n'ala anyị bụ Naijiria, Dọkịta Zhou Pingjian, n'ogige mmemme dị n'ụlọ akwụkwọ ahụ.

Otu jikọtara ndị nkuzi mahadum n'ala anyị akwụsịna abụbọ ọrụ ahụ ha malitere n'ọnwa Ọgọọstụ kemgbe ihe dịka izu ụka ise gara aga. Ọ bụ ezie na ha kwụsịrị ya, mana ha nyere gọọmenti etiti ụfọdụ ọnọdụ banyere nke ahụ. Onyeisi otu ASUU bụ ọkammụta Abiodun Ogunyemi kwuputara nke a n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n'Abụja bụ isi ala anyị ka ha na ndị nọchitere anya gọọmenti etiti nwechara nzukọ maka ya bụ abụbọ ọrụ.

More Articles ...