A kọwaala ịgụ akwụkwọ oge niile dịka ụzọ pụtara ìhè na usoro kacha mma isi chụọ ìtì bọrịbọ ọsọ ụkwụ erughị ala. Nke a bụ isi sekpụ ntị n'ọgbakọ nkwàlite mmụta na agụmakwụkwọ, bụ nke ọba akwụkwọ ala Nigeria, bụ 'National Library of Nigeria (NLN)' chịkọbàrà, map bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'Ebenebe, dị n'okpuru ọchịchị Awka South nke steeti Anambra.

Gọọmenti steeti Anambra, site n'aka isi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe metụtara ndị nne na ụmụaka na steeti ahụ, bụ 'Ministry of Women and Children Affairs' ebidorola ụmụaka ruru iri na isii n'ọnụ ọgụgụ akwụkwọ. Ụmụaka ahụ bụ ndị e tinyèrè n'ụlọ akwụkwọ n'isimbido izuụka a, ma bụrụkwa ndị a kpọtàrà site n'ogige ebe ụmụaka enweghị nne na nnà dị n'ebe dị iche iche.

Igbo sị na-abụ e too onye gburu ewu, ọ hụ ehi, o gbuo. N'ịgbaso nke a, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ na nso-nso a wee nabata ndị nkuzi ahụ sitere steeti Anambra, bụ ndị nwetara nturu ugo dị iche iche n'asọmpi a chịkọbara na mmemme ncheta ụbọchị ndị nkuzi na mba ụwa, nke ahọ 2019, bụ nke a chịkọbara n'Abụja.

More Articles ...