Nwa-afọ ala Igbo a ma ama maka ide akwụkwọ eturula ugo National Critics Book na mba Amerịka. Adiche nwetere nturu-ugo a maka akwụkwọ ahụ o dere nke a kpọrọ Americanah. Adiche kọrọ akụkọ nwata nwanyị onye Nigeria, hapụrụ ala nna ya gawa mba Amerịka maka ịgụ akwụkwọ.

Ụmụnna m ndị Igbo, ndị CISA na ndị Wachet, gịnị ka anyị na-anụ? Onye nwụrụ? Ihe ukwu emeela n’ụbọchị ahịa ukwu! Oke osisi ndị Igbo ji eme ọnụ a daala! Mbazụ igwe ndị Igbo ji akpaa nganga agbajiela! Ọnwụ egburule Akanaede akwụkwọ, Professor Albert Chinụalamọgụ Achebe, Dimkpa Agụ ndị Igbo, Nwa diala ndị Ogidi, Anambra State! Onye Oji deekara onye Bekee n'oyibo! Onye Oji kuziri onye Ọcha otu eji asụ ma na-ede okwu Bekee! Oke Agụ ụmụ Igbo ji eme ọnụ! Chai, ike agwụla!