Ọkụ Agbagwòóla Otu Ụlọ Na Ọtụtụ Ngwongwo n'Ọnịtshà

Azumahia
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ọ bụ nnọọ ụbọchị akwa na àrịrị n'Ọnịtsha na steeti Anambra dịka ọkụ dị egwu gbagwòrò ma gbapịa ụlọ na ngwongwo gburu nde kwùrú nde Naịra.

 

Ya bụ ụlọ ndị be Njaka, bụ nke dị n'okporo ụzọ St. Stephen ná mpaghara 'Inland Town', ma bụrụkwa nke e kwùrù na ọkụ gbarìkọrọ ihe niile dị n'ime ya kpamkpam.

N'okwu ọ gwàrà ndị nta akụkọ, otu nwa amadi n'ezinaụlọ ahụ ma bụrụkwa onye ọrụ agha mmiri lagoro ezumike nka, bụ maazị Okwudịlị Njaka kọwàrà na ya bụ ihe mèrè ha n'amaghị ama, nke bụ na o nweghị ihe ọbụla ha nwèrè ike izọpụtanwù na ya bụ ajọ ọkụ, ebe ọ gbapịchàrà ihe niie ha jiri biri.

O mere ka a mara na ha achọpụtàbèghị ihe kpatara ya bụ ọkụ ọgbụgba, ma sịkwa na nke ahụ ka na-agbagwòju ha anya n'ihi na ọkụ latiririiki adịghị oge ahụ ya bụ ihe mèrè.

fireoutbreak 1024x768 1

Na ntunye nke ya, onye ọzọ n'ezinaụlọ ahụ, bụ maazị Lawrence Njaka kwùrù na ya nụrụ ka mmadụ na-eti mkpu n'ogìgè ụlọ ahụ, n'ịkpọkù ndị mmadụ bànyéré ya bụ ọkụ oge ọ màlìtérè, mana tupu ha aghọta ihe na-eme, ọkụ agazuola ụlọ niile ahụ, ma gbaa ya pịa pịa n'otu ntabì anya.

O kèlèrè ndị ntororbịa na ndị agbataobi ndị gbataara ha ọsọ enyemaka n'oge ahụ, tupuu ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ abịaruo ka ọ gachàrà ihe dịka otù awa ihe niile jiri mee.

Ndị ezinaụlọ ahụ jikwàzịrị ohèrè ahụ wee rịọ enyemaka gọọmenti, ndị ụka, na ndị ọrụ obi ebere ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka n'igùzòbè ebe obibi ọzọ, n'ihi na ọ bụ naanị n'ụlọ ahụ ka ha bì.