ỌCHA Brigade Eburu Ozi Nkwalite Adịmọcha Gaa Ahịa Ọnịtsha

Azumahia
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Ndị ụlọ ọrụ 'Operation Clean and Healthy Anambra' bụ ndị a mààrà dịka ỌCHA Brigade eburula ozi nkuzi bànyere adịmọcha gburugburu wee bàá n'ime ahịa dị iche iche dị n'Ọnịtsha, iji wee kwàlite ezi ọnọdụ gburugburu bụ ịgbà ma bèlatakwa nsogbu a gbakata a kwụrụ a na-enwegasị n'okporo ụzọ dị iche iche na mpaghara ebe ahụ.

Ya bụ atụmatụ nkuzi bụ nke a nọrọ na ya wee dụọ ndị na-azụ ahịa na mpaghara ebe ahụ ka ha pụọ n'ọwà mmiri, ma dụkwa ndị na-akwọ ụgbọala ka ha zèére iburu maọbụ ibutuù mmadụ n'akụkụ okporo ụzọ, na-abụghị ebe e nwère ọdụ ụgbọala maọbụ ebe wepùtara maka ụgbọala ịkwụsị.

N'okwu ya oge ọ na-agwa ndị ahụ na-azụ ahịa n'Ọnịtsha okwu, onye duru ndị ỌCHA Brigade wee gaa ya bụ ọrụ, ma bụrụkwa onyeisi ụlọ ọrụ ahụ na mpaghara ọgbọ nta nkwàdo Anambra North, bụ Maazị Hilary Udeanọ kèlèrè ha maka otu ha siri jikọọ onwe ha ọnụ, bụzị nke mere e jiri gùzobere ha akụrụngwa a kpụrụ akpụ ga na-egbochi ndị ọkwọ ụgbọala ibu ụgbọala mabàta n'ihu ụlọ ahịa ha, ma nyekwa aka mee ka ụgbọala na ndị ji ọkpà na-agara onwe ha siriri-wèrèrè n'ahịa ahụ n'enweghị nsogbu ọbụla.

Ọ kpọkuzịkwara ma dụọ ndị ahụ ka ha gbasie mbọ ike ịhụ na ha chèkwàbàrà ihe ndị ahụ ma na-edebekawa gbùrùgburù ha ọcha oge niile.

N'ajụjụ ọnụ ndị nta akụkọ gbàrà ya, onyeisi ụlọ ahịa 'Amobi Plaza' bụ Maazị John Nwankwọ kèlèrè Gọvanọ Willie Obianọ maka iji ọmarịcha atụmatụ ahụ wee bịakute ha, ma kwekwazie nkwà na ha ga-elekọta ma leruo ihe ndị ahụ a rụnyèèrè ha anya nke ọma iji mee ka ọ nọtòóro ha aka.

Mpaghara ebe dị iche iche ndị òtù ahụ gàrà gụnyèrè mpaghara Upper Iweka, mpaghara ụzọ Owerri, Ọdụ Ụgbọala Asaba, Ọdụ Ụgbọala Lagos, ya na ebe njikọ ụzọ MCC bụ 'MCC Junction' nke ụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha, bụkwa ebe ha nọrọ wee dọọ ndị ahịa mbugharị na ndị ọkwọ ụgbọala na-anọchi okporo ụzọ aka na ntị, ka ha zèére ma sepu aka n'ihe dị otu ahụ n'ihi na onye ọbụla e jidere malitezie ugbua dịrị gaba gà-eji anya ya wee hụ ntị ya n'ejighị ènyò.