Gọọmenti Etiti nọrọ ụbọchị Wednezdee kwupụta ebumnobi ya iwe mmadụ puku iri asaa na ise n'ọrụ ugbo iji were tute mmụọ ndị ọrụ ugbo n'ịkọpụta nri. N'otu aka ahụ, o kewapụtakwara Otu Nzukọ maka Azụ nke Naijiria, nke nwere ebumnuche ịkwalite ịzụ azụ n'ala anyị dịka Naijiria mechiri oké ala ya niile n'ebe ịtụbata azụ n'ala anyị.

Aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụbọchị Wenezdee wee guzobe Ọkaikpe Manasseh Anyachebelu dịka onye ga-ejidegodi ọkwa Ọkaikpe Nkwụmọtọ steeti ahụ ugbua. Mmemme nguzobe ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ndị isi ọchịchị steeti ahụ na ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche.

Ụmụafọ obodo Ndịowu dị n'okpuru ọchịchị Orumba North na steeti Anambra enwetala akwụkwọ ndọrọ ego ruru otu nde Naịra na ụma ise iji wee malite ọrụ ebe obibi maka ndị ji otu ahọ efe ala nna anyị n'ụlọ akwụkwọ 'Community Secondary School, Ndiowu' n'okpuru amụma ọrụ mmepe ime-ime obodo a kpọrọ 'Anambra State Community and Social Development Agency (ASCSDA)' bụ atụmatụ ọrụ ụlọ ọba ego mba ụwa na-akwàdo.

More Articles ...

Page 1 of 3