Bukola Saraki ewubela amụma ịnye ndị ntorobịa ọrụ

Oru Aka
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Onye isi ụlọ nzụkọ sinet, Bukola Saraki, ewubego amụma O ji enyere ndị ntorobịa aka, ma kwe nkwa ịnye mmadụ puku iri anọ ọrụ na nke onwe ya.

N’okwu ya n’oge emume a nke ndị bịara ya gụnyere, gọvanọ Steeti Kwara, Maazị Abdulfatah Ahmed, ụfọdụ ndị ụlọ nzukọ omeiwu nke gọọmenti etiti, na ọnụ na-ekwuru ụlọ nzukọ Steeti Kwara, Dr Ali Ahmad.

Maazị Saraki gwara ndị ndu otu ndọrọ ndọrọ ala Naịjirịa ka ha gbaa mbọ na-enye ndị ntorobịa ọrụ iji belata oke enweghị ọrụ nke di n’ala Naịjirịa.

Okwukwara n’ịkwado ndị gọọmenti steeti ka ha na-aga n’ihu n’ikwado iwulite ndị ntorobịa bụ mkpebi nke ọchịchị ya.