E Guzobe Anyachebelu Dịka Onye Jigodi Ọkwa Ọkaikpe Ukwu Steeti Anambra

Oru Aka
Typography
  • Smaller Small Medium Big Bigger
  • Default Helvetica Segoe Georgia Times

Aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụbọchị Wenezdee wee guzobe Ọkaikpe Manasseh Anyachebelu dịka onye ga-ejidegodi ọkwa Ọkaikpe Nkwụmọtọ steeti ahụ ugbua. Mmemme nguzobe ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ndị isi ọchịchị steeti ahụ na ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche.

N'okwu ya dịka ọ na-eme mmemme nguzobe ahụ kpọmkwem, Gọvanọ Obianọ kọwara ọrụ ikpe dịka ọrụ dị oke mkpà, na nke chọrọ onye nwere ezi ọgụgụ isi na onye ñụjuru mmiri ara afọ n'ihi ihe dị iche iche dị na ya, bụzị nke mere e ji eleru anya nke ọma tupu e guzobe onye ọbụla ịnọ n'isi ya.

Ọ kpọkùzịkwàrà ma dụọ ya bụ nwa amadi ka o tinye ọkacha mma ya n'ọrụ ahụ ma were ume na ike ya niile wee rụọ ya bụ ọrụ iji mepụta ihe dara ụda dịka maọbụ karịa ka ndị nke jịbụrụ ya bụ ọkwa n'oge mbụ mèrè. Nke a, dịka o siri kọwaa, ga-enye aka imezùpụta ezi ebumnobi ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ nwèrè iwètàrà ụmụafọ steeti ahụ ezi usoro ikpe mkwụmọtọ bụ ịgba.

Na nzaghachi, Ọkaikpe Anyachebelu kelere Chineke na isi ọchịchị steeti ahụ maka mbuli n'ọkwa ahụ dị elu, ma kwekwazie nkwà na ọ ga-eji obi ya niile wee za ya bụ ọkpụkpọ òkù ma gaara steeti ya na ala Nigeria ozi n'ogoogo ọhụụ ahụ, site n'inye aka Chineke.
Anyị ga-echeta na ọ bụ Ọkaikpe Ijem Ọnwụamaegbu bụ onye jibụ ọkwa ahụ, ma bụrụkwa nwaanyị mbụ jigoro ya bụ ọkwa na steeti ahụ. Ma ọ nọrọ na nso-nso a wee laa ezumike nka n'ọrụ oyibo, dịka ọ gbàgòrò ahọ iri isii na ise, bụ oge e ji ala ezumike nka n'ọrụ oyibo n'ala Nigeria, nke mezịrị e jiri kpọlite Ọkaikpe Anyachebelụ, bụ onye kachara bụrụ isi ugbua n'ogoogo ngalaba ikpe steeti ahụ ugbua.

Ndị dị iche iche sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè ode akwụkwọ ukwu steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ; Ọkaikpe Ijem Ọnwụamaegbu; onyeisi ndị ọrụ nyegara gọvanọ, bụ Maazị Primus Ọdịlị; Kọmishọna ikpe nkwụmọtọ na steeti ahụ, bụ Dọkịta Uju Nwọgụ, tinyere ndị ọrụ ikpe na ya bụ steeti.